5 Site n'olu ize-umem Ọkpukpum araparawo n'anu-arum.
5 Nʼihi oke ịsụ ude m na-asụ, enwekwaghị m anụ ahụ ọbụla nʼahụ m. Abụ m naanị ọkpụkpụ.
Dika okoko-osisi ka ọ putaworo, ewe nēbipu ya: O we nāb͕alaga dika onyinyo, ọ dighi-eguzo kwa.
Ọkpukpum nārapara n'akpukpọ-arum na n'anu-arum, M'we were akpukpọ ezém wepuga onwem.
Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ize-umem; Kwa-abali ka m'nēme ka ihe-ndinam se n'elu anya-mirim; Ejim anya-mirim de ihe m'ji edina.
Si n'ebe m'nọ wezuga onwe-unu, unu nile ndi nālu ajọ ihe; N'ihi na Jehova anuwo olu ákwám.
N'ututu ọ nāb͕awa uzari, nētó kwa etó; N'anyasi ka anēbipu ya, o we kpọnwua.
Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka aru di nma: Ma mọ madu nke etib͕uru etib͕u nāmikọ ọkpukpu.
Udi-aru-ha ab͕awo ọchichiri kari iji-nji; amataghi ha n'èzí: Akpukpọ-ha araparawo n'ọkpukpu-ha; ọ kpọnwuwo, ọ ghọwo ihe di ka osisi.
Ọ bu kwa otú a ka Elkena nēme kwa-arọ, mb͕e ọ bula Hana rigoro n'ulo Jehova, otú a ka Penina nākpasu ya iwe; o we kwa ákwá, ghara iri ihe.