Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 102:2 - Bible Nso

2 Ezonarilam iru-Gi n'ubọchi ahuhu m'nāhu: Tọ nti-Gi n'ala n'ebe m'nọ; N'ubọchi m'nākpọku Gi zam ngwa ngwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Ezonarịla m ihu gị nʼụbọchị nsogbu m. Gee ntị nʼekpere m, zakwaa m ngwangwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 102:2
21 Iomraidhean Croise  

Mb͕e Ya onwe-ya nēme ka anọ jū, ònye gāma kwa ikpe? Mb͕e O nēzobe iru-Ya, ònye gēkiri kwa Ya? Ma ọ bu n'ebe mba nọ, ma-ọbu n'ebe madu nọ, n'otù aka ahu:


Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.


I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha.


Jehova, rùe ole mb͕e ka I gēchezọm ebighi-ebi? Rùe ole mb͕e ka I gēzonarim iru-Gi?


Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.


Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe.


Ma Gi onwe-gi, Jehova, anọla n'ebe di anya: Gi ikem, bia ọsọsọ iyerem aka.


Ezonarilam iru-Gi; Ejila iwe wezuga orù-Gi: Iye-akam ka I buworo; Ab͕anarilam, arapu-kwa-lam, Chineke nke nzọputam.


Tọrọm nti-Gi n'ala; naputam ngwa ngwa: Ghọrọm oké nkume nke ebe siri ike, bú ulo nke ebe ewusiri ike nke-uku izọputam.


Jehova, ka ọ tọ Gi inaputam: Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.


Ezonari-kwa-la orù-Gi iru-Gi; N'ihi na nkpà nākpam; me ngwa zam.


Chineke, bia ọsọsọ inaputam; Jehova, bia ọsọsọ iyerem aka.


N'ezi omume-Gi naputam, me ka m'b͕apu: Tọrọm nti-Gi n'ala, zọputam.


O rue, n'ọtutu ubọchi ahu, na eze Ijipt nwuru: umu Israel we nēze ume n'ihi òfùfè-ha, ha we tie nkpu, ntiku ha tikuru Chineke we rigorue Chineke nti, n'ihi òfùfè ahu.


Chineke we nu isu-ude-ha, Chineke we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya, nke Ya na Abraham na Aisak na Jekob b͕ara.


Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.


O gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mb͕e ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu.


M'gēchere kwa Jehova, Nke nēzonari ulo Jekob iru-Ya, m'gēle kwa anya Ya.


Ọ dighi ọnwunwa ọ bula nwaworo unu ma-ọbughi nke madu nānagide: ma Chineke kwesiri ntukwasi-obi, Onye nāgaghi-ekwe ka anwa unu kari nke unu puru inagide; kama n'oge ọnwunwa ahu Ọ gēme kwa uzọ nb͕apu, ka unu we nwe ike inagide ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan