Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Ọma 1:2 - Bible Nso

2 Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu Onyenwe anyị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu Onyenwe anyị ehihie na abalị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Ọma 1:2
24 Iomraidhean Croise  

Aisak we pua itughari uche-ya n'ọhia na mb͕e anyasi: ọ welie anya-ya abua, hu, ma, le, camel ufọdu nābia.


N'ihi na Ezra doziri obi-ya ichọ iwu Jehova, na ime ya, na izí ukpuru-Ya na ikpé-Ya n'Israel.


Adighm-apu kwa n'ihe enyere n'iwu nke eb͕ub͕ere-ọnu-Ya; Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm.


Ka ntughari-uchem tọ Ya utọ: Mu onwem gāṅuri ọṅu nime Jehova.


Tonu Ja. Onye ihe nāgara nke-ọma ka nwoke ahu bu nke nātu egwu Jehova. Nke ihe nile O nyere n'iwu nātọ utọ nke-uku.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


N'obim ka m'zobeworo okwu-ọnu-Gi, Ka m'we ghara imehie megide Gi.


Me ka m'zọ ije n'okporo-uzọ nke ihe nile I nyere n'iwu; N'ihi na uzọ ahu nātọm utọ


Iwu ọnu-Gi dim nma Kari ọla-edo na ọla-ọcha nādighi iguta-ọnu.


Asi na iwu-Gi abughi ihe nātọm utọ nke-uku, Mb͕e ahu m'gālawori n'iyì nime nweda-n'alam.


Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; Iwu-Gi di kwa nime obim.


Jehova, Chineke nke nzọputam, N'ehihie ka m'tiworo nkpu, n'abali kwa, n'iru Gi:


Achọputawo okwu-Gi, m'we rie ha; okwu-Gi we ghọrọm ihe-obi-utọ na ọṅù obim: n'ihi na akpọkwasiwom aha-Gi, Jehova, Chineke nke usu nile nke ndi-agha.


Ma Chineke, Ọ̀ gaghi-ekpeputa ndi nke Ya arọputara, ndi nākpọku Ya ehihie na abali, O nwe-kwa-ra ogologo ntachi-obi n'ebe ha nọ?


o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.


N'ihi na mu na iwu Chineke nēnwekọ obi-utọ dika madu imem si di:


N'ihi na unu nēcheta, umu-nna-ayi, ndọb͕u ayi nādọb͕u onwe-ayi n'ọlu na ihuju-anya-ayi: n'ihi na ayi nālu ọlu abali na ehihie, ka ayi we ghara ibob͕u onye ọ bula nime unu, ayi we kwusara unu ozi ọma nke Chineke.


Nējisi ike n'ihe ndia; nānọsi ike nime ha; ka iga-n'iru-gi we puta ìhè n'ebe madu nile nọ.


Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka,


Akwukwọ iwu a agaghi-apu n'ọnu-gi, kama i gātughari uche nime ya ehihie na abali, ka i we lezie anya ime dika ihe nile si di nke edeworo nime ya: n'ihi na mb͕e ahu i gēme ka ije-gi ga nke-ọma, mb͕e ahu i gēnwe kwa uche.


N'ihi na nka bu ihu-n'anya Chineke, ka ayi debe ihe nile O nyere n'iwu: ihe O nyere n'iwu adighi kwa arọ́.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan