Sanbalat, bú onye Horonaim, na Tobaia, bú orù, bú onye Amon, na Geshem, bú onye Arebia, we nu ya, ha we chìa ayi ọchì, leda ayi anya, si, Gini bu ihe a nke unu onwe-unu nēme? ọ̀ bu eze ka unu nānupu isi imegide?
Ma ndi mbu nāchi ala ndi burum uzọ, ha bob͕uru ndi-Ju ibu arọ́, we nara ha utu n'achicha na manya-vine, tiyere ọgu shekel ọla-ọcha abua; ọbuná ndi nējere ha ozi bu ndi-isi n'ebe ndi-ayi nọ: ma mu onwem emeghi otú a, n'ihi egwu Chineke.
N'ihi na M'gaghi-enwe kwa ọmiko ọzọ n'aru ndi bi n'ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): ma, le, Mu onwem gaje irara madu ndia nye, onye ọ bula n'aka ibe-ya na n'aka eze-ya: ha gētib͕u kwa ala nka, M'gaghi-anaputa kwa ha n'aka-ha.