Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.
Ndi-okenye nke ada Zaion nānọdu ala, dere du; Ha ekpokwasiwo ájá n'isi-ha; ha ekewo ákwà-nkpe n'úkwù-ha: Umu-ab͕oghọ Jerusalem ndi nāmaghi nwoke erulatawo isi-ha n'ala.
Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?