Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Akwa 4:16 - Bible Nso

16 Iru Jehova ekesawo ha; Ọ gaghi-elegide kwa ha anya ọzọ: Madu ahughi ndi-nchu-àjà iru-ọma, ha emeghi ndi-okenye amara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Onyenwe anyị nʼonwe ya achụsaala ha. Ọ gaghị agụnyekwa ha. Ọ dịkwaghị ndị na-asọpụrụ onye nchụaja, ọ dịkwaghị ndị na-emere ndị okenye amara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Akwa 4:16
20 Iomraidhean Croise  

Ihe anābu ọnu ka iwe-ha bu, n'ihi na ọ di ike; Ọnuma-ha bu kwa ihe anābu ọnu, n'ihi na o sika ike: M'gēkesa ha nime Jekob, B͕asa kwa ha n'Israel.


O we me ka eze Kaldea rigokwasi ha, o we were mma-agha b͕ue umu-okorọbia-ha n'ulo ebe nsọ ha, o nweghi kwa ọmiko n'aru nwa-okorọbia, ma ọbu n'aru nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, ma-ọbu n'aru okenye, ma-ọbu n'aru onye kara nká: ha nile ka O nyere n'aka-ya.


Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile.


O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha:


O gēru kwa, na ka o si diri ndi ọ bula, otú a ka ọ gādiri onye-nchu-àjà; dika o si diri orù, otú a ka ọ gādiri onye-nwe-ya; dika o si diri nwanyi nēje ozi, otú a ka ọ gādiri nwanyi-nwe-ya; dika o si diri onye nēgo ego, otú a ka ọ gādiri onye nēre ere; dika o si diri onye-nbinye, otú a ka ọ gādiri onye-nbite; dika o si diri onye nānara uma, otú a ka ọ gādiri onye nēnye ya uma.


Ewesaram ndim iwe, emerem ihe-nketam ka ọ ghara idi nsọ, M'we nye ha n'aka-gi: i nweghi obi-ebere n'aru ha; n'aru agadi ka i meworo ka yoke nke gi di arọ́ nke-uku.


M'gēwere kwa ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, n'ihi Manase nwa Hezekaia, bú eze Juda, n'ihi ihe o mere na Jerusalem.


M'gēwere ha nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari, iburu ha ihe ọjọ; ibu ihe-ita-uta, na ilu, na ihe-àkùkù, na ihe-nkọcha, n'ebe nile M'gāchusa ha.


Onye-isi ndi-ob͕ū we chiri Seraia, bú onye-isi-nchu-àjà, na Zefanaia, bú onye-nchu-àjà nke-abua, na ndi-nche atọ nke nbata-uzọ:


Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?


Ọ napuwo kwa ulo-ntu-Ya n'ike, dika agāsi na ọ bu nke ubi ab͕ara ogige; O bibiwo mb͕e-Ya akara àkà: Jehova emewo ka echezọ mb͕e akara àkà na ubọchi-izu-ike nime Zaion, O we ju eze na onye-nchu-àjà n'ọmuma nke iwe-Ya.


Ekobere ndi-isi n'aka-ha: Asọpughi iru ndi-okenye.


N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.


Jehova gēme ka etib͕ue gi n'iru ndi-iro-gi: n'otù uzọ ka i gāpukuru ha, ma n'uzọ asa ka i gāb͕alaga n'iru ha: i gāghọ-kwa-ra ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


Asiwom, M'gāfupu ha, Me ka ncheta-ha kwusi n'etiti madu:


Ọ bughi dika ọb͕ub͕a-ndu ahu si di nke Mu na ndi bu nna-ha b͕ara N'ubọchi M'jidere ha n'aka isi n'ala Ijipt duputa ha; N'ihi na ha onwe-ha anọgideghi n'ọb͕ub͕a-ndum, Mu onwem lefukwara ha anya, ka Onye-nwe-ayi kwuru,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan