Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Akwa 4:10 - Bible Nso

10 Aka ndinyom ndi nwere obi-ebere esiwo umu-ha n'ite; Ha aghọworo ha ihe-oriri na ntipia nke ada ndim.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

10 Aka ha ka ndị inyom ndị ahụ nwere obi ebere ji gbuo ụmụ ha, sie ha. Ụmụ ha ghọọrọ ha nri nʼoge ahụ a lara ndị m nʼiyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Akwa 4:10
12 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi nke-iteghete nke ọnwa nke-anọ oké unwu siri ike n'obodo ahu, ọ dighi kwa nri ndi ala ahu nwere.


Gi nke juputara na nbib͕ọ, obodo nke nātu ùzù, obodo nāṅuri ọṅu-agha; ndi-gi eb͕uru eb͕u abughi ndi eji mma-agha b͕ue, ha abughi kwa ndi nwuru anwu n'agha.


Nwanyi, ọ̀ gēchezọ nwa-ya nāṅu ara, we ghara inwe obi-ebere n'aru nwa afọ-ya? e, eleghi anya ndia gēchezọ, ma Mu onwem agaghi-echezọ gi.


M'gēme kwa ka ha rie anu-aru nke umu-ha ndikom na anu-aru umu-ha ndinyom, ha gēri kwa, onye ọ bula anu-aru ibe-ya, nime nnọchigide-n'agha na nime nkpab͕u, nke ndi-iro-ha na ndi nāchọ ndu-ha nākpab͕u ha.


Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.


Le, Jehova, legide onye I meworo otú a anya! Ndinyom, hà gēri nkpuru-ha, bú umu-ntakiri anātughari n'aka? Àgēb͕u onye-nchu-àjà na onye-amuma n'ebe nsọ nke Onye-nwe-ayi?


Ọtutu iyi nke juputara na miri ka anyam nērùda, n'ihi ntipia nke ada ndim.


Ọbuná nkita-ọhia eseputawo ara, me ka umu-ha ṅua ara: Ada ndim aghọwo onye nēnweghi obi-ebere, dika enyi-nnunu n'ọzara.


N'ihi nka ka ndi bu nna gēri umu-ha n'etiti gi, umu gēri kwa ndi bu nna-ha; M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe nime gi, M'gāb͕asa kwa ndi-gi nile fọduru nye ifufe nile.


Unu gēri anu-aru umu-unu ndikom, anu-aru umu-unu ndinyom ka unu gēri kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan