Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Akwa 2:11 - Bible Nso

11 Anyam abua adalawo n'isi site n'anya-miri, ngiri-afọm anuwom ọku, Awusiwo umejum n'ala dika miri, n'ihi ntipia nke ada ndim; N'ihi na umu-ntakiri na umu nke nāṅu ara nāda #mbà n'amá nile nke obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ike agwụla anya m nʼihi ịkwa akwa, ime ime ahụ m na-anụ ọkụ. Obi m dị ka ihe a wụpụrụ nʼala, nʼihi na e bibiela ndị m, nʼihi na ụmụntakịrị na ụmụ a mụrụ ọhụrụ na-ada mba nʼokporoụzọ nke obodo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Akwa 2:11
26 Iomraidhean Croise  

Àkú-Ya nile dim buruburu, Ọ nāb͕awa akurum, Ọ dighi-enwe kwa ọmiko n'arum; Ọ nāwusi òlùlùm n'ala.


Ngiri-afọm nile nāb͕o ab͕ọ, ha anọghi jū; Ubọchi nweda-n'ala nile abiawo n'irum.


Anyam abua adalawo n'isi site n'ichọsi okwu-Gi ike, Mb͕e m'nāsi, Òle mb͕e I gākasim obi?


Dika miri ka awusiworom, Ọkpukpum nile ekesawo onwe-ha: Obim aghọwo ihe dika wax; Ọ lọwo miri n'etiti afọm.


Merem amara, Jehova, n'ihi na anọm na nkpab͕u: Anyam emebiwo nime nkpasu-iwem, ya na nkpuru-obim, na afọm, dika uwe nla mebiri.


Arum esinwuwo, egwepiawokwam nke-uku: Ab͕ọwom uja n'ihi isu-ude nke obim.


Anyam emebiwo site na nkpasu-iwem dika uwe nla mebiri; Ọ kawo nká n'hi ndi-nkpab͕um nile.


Adọb͕uwom onwem n'ọlu n'ikpọ-òkùm; akpiri akpọsiwom nku: Anyam abua adalawo n'isi, mb͕e m'nēchere Chinekem.


N'ihi nka ka m'siri, Lepunum anya, m'gākwakpọ anya; unu adọgbula onwe-unu ikasim obi, n'ihi nbibi ada nke ndim.


Dika eleke ma-ọbu ub͕ala, otú a ka m'nēbe ebe; Anamekwo ákwá dika nduru: anyam abua atalatawo n'ile anya n'elu; Jehova, anēmeb͕um emeb͕u, nọrọm mbe.


Umu-gi ndikom atubọwo atubọ, dina ala n'isi èzí nile, dika anigọ mara n'ọnyà; ha bu ndi juputara n'ọnuma Jehova, na ibasi-nba-ike Chineke-gi.


I gāgwa kwa ha okwu a, si, Ka anya-miri si n'anyam erùda abali na ehihie, ka ha ghara kwa iguzo du; n'ihi na nb͕aji ukwu na aka di uku ka ejiworo b͕aji ada ndim nāmaghi nwoke, ọ bu ntiputa-ọnyá nke jọrọ njọ nke-uku.


Ngiri-afọm, ngiri-afọm! anamab͕ali na mb͕idi nile nke obim; obim nāsu udè nke-uku nimem; adighm-ab͕a nkiti; n'ihi na olu opì-ike ka i nuworo, nkpuru-obim, bú udà-opì agha.


Ma ub͕u a otú a ka Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: N'ìhi gini ka unu onwe-unu nēme ihe ọjọ di uku megide nkpuru-obi unu, ibipu n'ulo-unu nwoke na nwanyi na nwatakiri na nwa nāṅu ara, ka ha pua n'etiti Juda, ewe me ka ọ ghara idi ndi fọduru gāfọduru unu;


Le, ọ bu olu ntiku nke ada ndim site n'ala di anya nke-uku: Jehova, Ọ̀ nọghi na Zaion? Eze-ya, Ọ̀ nọghi nime ya? Gini mere ha ji were arusi nile ha apiri api, were kwa ihe-efu nile nke onye ala ọzọ, kpasuem iwe?


Ndi-ya nile nēze ume, ha nāchọ nri; Ha enyewo ihe nile ha anāchọsi ike n'ọnọdu ihe-oriri iweghachi nkpuru-obi: Le, Jehova, legide anya; n'ihi na aghọwom ihe jọb͕uru onwe-ya.


N'ihi ihe ndia ka mu onwem nākwa ákwá; anyam, anyam nērùda miri; N'ihi na onye-nkasi-obi nke nēweghachi nkpuru-obim di anya n'ebe m'nọ; Umum tọb͕ọrọ n'efu, n'ihi na onye-iro di ike.


Le, Jehova; n'ihi na ahuhu dirim; ngiri-afọm nānum ọku; Obim nātughari nimem; n'ihi na enupuwom isi nke-uku: N'èzí mma-agha ab͕abawom aka nwa, n'ulo ihe dika ọnwu di.


N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.


N'ihi na le, ubọchi nābia, mb͕e ha gāsi, Ngọzi nādiri ndinyom àgà, na afọ nke nāmughi nwa, na ara nke nāzùghi nwa.


Devid na ndi ya na ha nọ we welie olu-ha kwa ákwá, rue mb͕e ike nādighi ha n'aru ọzọ ikwa ákwá.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan