Abụ Akwa 1:9 - Bible Nso9 Ọrurú-ya di n'ọnu-ọnu-ala nile nke uwe-nwuda-ya; o chetaghi ikpe-azu-ya; O we rida n'uzọ di ebube; ọ dighi onye-nkasi-obi o nwere: Jehova, le nweda-n'alam; n'ihi na onye-iro emewo onwe-ya ka ọ di uku. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a9 Ịrụ arụ ya pụtara ihe, ọ bụladị nʼuwe ya. Ọ dịkwaghị mgbe o chere echiche banyere ihe dị na-eche ya nʼoge dị nʼihu. Lee ka o si daa, dasie ike, ma ọ dịghị onye bịara kasịe ya obi. “Onyenwe anyị, lee nsogbu m niile. Lee ka ndị iro si merie m.” Faic an caibideil |
Ma ub͕u a, Chineke-ayi, Chineke uku, Nke bu dike, Nke di kwa egwu, Gi Onye nēdebe ọb͕ub͕a-ndu na ebere, ka ike-ọgwugwu nile ghara idi ntà n'iru Gi, bú nke gwuworo ayi, gwu kwa ndi-eze-ayi, gwu kwa ndi-isi-ayi, gwu kwa ndi-nchu-àjà-ayi, gwu kwa ndi-amuma-ayi, gwu kwa nna-ayi-hà, gwu kwa ndi-Gi nile, site n'ubọchi ndi-eze Asiria rue ta.
Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.