Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Abụ Akwa 1:22 - Bible Nso

22 Ka ihe ọjọ nile ha bia n'iru Gi; Gi me kwa ha, dika I meworom n'ihi njehiem nile: N'ihi na ize-umem di ọtutu, aru adighi kwa obim ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 “Kwere ka ihe ọjọọ niile ha na-eme bịa nʼihu gị. Mesokwa ha mmeso dịka i si mesoo m nʼihi mmehie niile nke m. Nʼihi na ịsụ ude m dị ọtụtụ, ana m adakwa mba nʼobi m.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Abụ Akwa 1:22
16 Iomraidhean Croise  

Ọ gādim nọ̄ nma ma asi na agamab͕asa irum megide unu taa! n'arum ka aru nādighi obim ike.


ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?


N'ihi nka ariọm aririọ ka ike ghara igwu unu n'obi nime nkpab͕um nile n'ihi unu, nke bu otuto-unu.


N'ihi na asi na ha nēme ihe ndia mb͕e osisi di ndu, gini ka agēme mb͕e ọ kpọrọ nku?


N'ihi nka ka aru nādighi obi-ayi nma; N'ihi ihe ndia ka anya-ayi b͕aworo ọchichiri.


N'elu ka O siri zite ọku n'ọkpukpum nile, o we nwe ike n'aru ha: Ọ b͕asaworo ukwum abua ub͕u, O mewo ka m'laghachi azu; O mewom ka m'ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na onye aru nādighi ike ogologo ubọchi nile.


Ihe-ikem na nke anu-arum di n'isi Babilon, ka nwanyi nke bi na Zaion gāsi; ọzọ, Ọbaram di n'isi ndi bi na Kaldea, ka Jerusalem gāsi.


Ma Gi onwe-gi, Jehova, amawo ndum-ọdu nile ha imegidem ime ka m'nwua; ekpuchila ajọ omume-ha, ehichapu-kwa-la nmehie-ha n'iru Gi: ma ka ha ghọ ndi emeworo ka ha su ngọngọ n'iru Gi; meso ha na mb͕e iwe-Gi.


Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


N'ihi nke a-aka nile gākuda, obi ọ bula nke madu gālọ kwa ya miri:


Zam ngwa ngwa, Jehova; mọm agwusiwo: Ezonarilam iru-Gi; Ka m'we ghara iyi ndi nārida n'olùlù.


N'ìhi gini ka mba nile nāsi, Òle ebe Chineke-ha nọ? Ka amara ya n'etiti mba nile n'anya-ayi, Bú ibọ̀-ọ́bọ̀ ọbara nke ndi-orù-Gi nke awusiworo.


N'ihi nka agēripia ndi nile nēripia gi; ọzọ, ndi nile ndi nākpab͕u gi, ha nile, na ndọta-n'agha ka ha gāla; ndi nāpunara gi ihe gāghọ ihe apunaraworo n'aka madu, ọ bu kwa ndi nile nke nāluta ihe-gi n'agha ka M'gēnye ka ha ghọ ihe-nluta-n'agha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan