Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 3:14 - Bible Nso

14 Ma gi onwe-gi, nọgide nime ihe nile i mutara, nke eme-kwa-ra ka i kwere ha, ebe i matara madu ndi i mutara ha n'ọnu-ha;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nʼihe ịmụtara na ihe i kwenyesịrị ike na ya, ebe ị maara onye i si nʼaka ya mụta ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 3:14
12 Iomraidhean Croise  

ebe O debeworo otù ubọchi, nke Ọ gēkpe elu-uwa dum madu bi ikpé n'ezi omume nime ya site n'aka otù Nwoke Ọ kara àkà; O nye-kwa-ra madu nile ihe ha gēji kwere nka, ebe Ọ mere ka O si na ndi nwuru anwu bilie.


Otù onye nārọputa otù ubọchi kari ubọchi ọzọ: ma onye ọzọ nārọputa ubọchi dum. Ka onye ọ bula nēkwezu nime uche nke aka ya.


ka ewe kasie obi-ha, ebe ejikọ-kwa-ra ha n'ihu-n'anya, ka ha we ru kwa àkù nile nke nkwezu ahu nke nghọta nēkwezu, ka ha we mazu ihe-omimi nke Chineke, bú Kraist,


na ọ bughi nání n'okwu-ọnu ka ozi ọma ayi biaruru unu, kama ọ bia-kwa-ra n'ike, na nime Mọ Nsọ na ọtutu nkwezu; dika unu matara aha madu a huru na ayi bu n'ebe unu nọ n'ihi unu.


Ọ bu kwa n'ihi nka ka ayi onwe-ayi nēkele kwa Chineke nēwepughi aka, na, mb͕e unu natara okwu nke unu nuru n'ọnu-ayi, bú okwu nke Chineke, ọ bughi okwu madu ka unu nara nke-ọma, kama, otú ọ di n'ezi-okwu, ọ bu okwu Chineke, nke nālusi kwa ọlu ike nime unu ndi kwere ekwe.


Riba onwe-gi na ozizí-gi ama. Nānọgide n'ihe ndia; n'ihi na n'ime nka i gāzọputa onwe-gi zọputa kwa ndi nānu olu-gi.


Jide ihe ilere anya nke okwu nēnye ezi ndu nke i nuru n'ọnum, nime okwukwe na ihunanya nke di nime Kraist Jisus.


Ihe nile i nukwara n'ọnum site n'etiti ọtutu ndi-àmà, nye ihe ndia n'aka madu ndi kwesiri ntukwasi-obi idebe, bú madu ndi ọ gēkwe kwa izí madu-ibe-ha ihe ndia.


ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.


nējide okwu ahu nke kwesiri ntukwasi-obi nke di ka ozizí-ayi si di, ka o we pu idusi ọdu ike nime ozizí nke nēnye ezi ndu, na itu kwa ndi nēkwugide ekwugide nmehie-ha n'anya.


ka ayi were obi ezi-okwu biarue nso nime nkwezu nke okwukwe, buru kwa ndi efesaworo ọbara n'obi-ayi pua n'ajọ akọ-na-uche, ndi asachawo-kwa-ra aru-ayi na miri di ọcha:


Ma ọ nāgu ayi agu ka unu nile n'otù n'otù we nēgosi otù inu-ọku-n'obi ahu ka unu we nwezue olile-anya-ayi rue ọgwugwu ihe nile:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan