Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 3:13 - Bible Nso

13 Ma ajọ madu nile na ndi-aghughọ gānaga n'iru n'ijọkari njọ, nēduhie ndi ọzọ, anēduhie kwa ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Ma ndị mmadụ ọjọọ na ndị na-ebi ndụ aghụghọ ga-ajọ njọ karịa ka ha dị. Ha ga-eduhie ndị ọzọ, ma bụrụkwa ndị a ga-eduhie.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 3:13
15 Iomraidhean Croise  

N'aka-Ya ka ike na nzube-ihe di; O nwere onye nēmehie n'amaghi-ama na onye nēme ka madu mehie n'amaghi-ama.


Ọ bu onye ji ntu azù onwe-ya: obi akwara emò ewezugawo ya, o we ghara inaputa nkpuru-obi-ya, ma ọbu isi, Ọ̀ bughi okwu-ugha, bú ihe di n'aka-nrim?


O we sim, I gāhu kwa oké ihe-árú ọzọ di iche iche nke ha onwe-ha nēme.


site n'otuto na ihe-ihere, site na nhota ọjọ na nhota ọma; dika ndi-nduhie, ma ayi bu ndi ezi-okwu;


Ma Mọ Nsọ nēkwuwa okwu, si, na n'oge ikpe-azu ufọdu gēwezuga onwe-ha n'ebe okwukwe-ayi di, nāṅa nti ndi-mọ nēduhie eduhie na ozizí nke ndi-mọ ọjọ,


Ma otù uzọ ahu Janis na Jambris guzogidere Moses, otú a ka ndia nēguzogide kwa ezi-okwu ahu; bú madu ndi mebiworo n'uche, ndi ajuru aju n'ihe bayere okwukwe-ayi.


N'ihi na ayi onwe-ayi buru kwa ndi nēnweghi uche n'oge gara aga, ndi nēkweyeghi, ndi anēduhie, ndi bu orù agu ihe ọjọ na ihe-utọ di iche iche, nēbi n'obi ọjọ na ekworo, ndi-ùrú, nākpọrita ibe-ayi asì.


N'ihi na asi na, mb͕e ha b͕anariworo ihe nile emeruru emeru nke uwa site na nmazu nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist, ewe nime ihe ndia, meri kwa ha, ọnọdu ikpe-azu ha abiawo jọkari ọnọdu mbu njọ.


ebe unu buru uzọ mara nka, na ndi-ọchìe gēji ichì-ọchì bia na mb͕e ikpe-azu, nāga dika agu ihe ọjọ nke aka ha si di,


Ewe chudà dragon uku ahu, bú agwọ ochie ahu, onye anākpọ Ekwensu na Setan, onye nēduhie uwa nile madu bi; achudara ya n'uwa, chudà kwa ndi-mọ-ozi-ya, ha na ya.


O we nēduhie ndi bi n'elu uwa n'ihi ihe-iriba-ama nile nke enyere ya ike ime n'iru anu-ọhia ahu; nāsi ndi bi n'elu uwa, ka ha kpuara anu-ọhia ahu ihe-oyiyi, bú nke nwere ob͕ub͕u-mma-agha ahu, we di ndu.


ìhè nke oriọna agaghi-enwu kwa nime gi ọzọ ma-ọli; agaghi-anu kwa olu nke onye nālu nwunye ọhu na nke nwanyi anālu ọhu nime gi ọzọ ma-ọli: n'ihi na ndi-ahia-gi buri ndi-amadi nke uwa; n'ihi na ewere igwọ-nsi-gi duhie mba nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan