Òle onye-agha nēwere ego-ọlu nke aka ya lua ọlu onye-agha mb͕e ọ bula? ònye nāku ubi-vine, nādighi-eri kwa nkpuru-ya? ma-ọbu ònye nāzù ìgwè aturu, nādighi-eri kwa ihe putara na miri-ara ìgwè aturu ahu?
Ma ọ buru na anākpab͕u ayi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu na nzọputa-unu; ọ buru kwa na anākasi ayi obi, ọ bu n'ihi nkasi-obi-unu, nke nālusi ọlu ike n'itachi obi n'otù ahuhu ahu nke ayi onwe-ayi nāhu kwa:
Ngọzi nādiri nwoke onye nātachi obi n'ọnwunwa: n'ihi na mb͕e anwaputaworo ya, ọ gānata okpu-eze ahu, bú ndu, nke Onye-nwe-ayi kwere nkwa inye ndi huru Ya n'anya.