Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 2:1 - Bible Nso

1 Ya mere, gi onwe-gi, nwam, ka eme ka i di ike n'amara nke di nime Kraist Jisus.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Ya mere, nwa m, bụrụ onye dị ike site nʼamara ahụ Kraịst Jisọs na-enye.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 2:1
14 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),


Nēchenu nche, nēguzosinu ike n'okwukwe-unu, burunu ndikom, nādinu ike.


Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.


Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.


Iwu a ka m'nēnye n'aka-gi idebe, nwam Timọti, dika amuma nile si di nke eburu uzọ bu bayere gi, ka i we were ha bu agha ọma nka;


anamedegara Timọti akwukwọ, bú ezi nwam n'okwukwe: Amara na ebere na udo diri gi nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


Pọl, onye-ozi nke Kraist Jisus site n'ọchichọ nke Chineke, dika nkwa nke ndu ahu nke di nime Kraist Jisus si di,


nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.


N'ihi na Chineke enyeghi ayi mọ nke ujọ; kama ọ bu nke ike na ihunanya na ime ka uche zuo okè.


N'ihi nka ka m'nwere ntachi-obi n'ihe nile n'ihi ndi arọputara, ka ha onwe-ha we ru kwa nzọputa nke di nime Kraist Jisus, ya na ebube ebighi-ebi.


Ma Onye-nwe-ayi guzorom nso, we me ka m'di ike; ka ewe were ọnum kwusazue nkwusa ahu, ka ndi mba ọzọ nile we nu kwa: ewe dọputam n'ọnu ọdum.


Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.


Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan