Ma ub͕u a, di ike, Zerubabel, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta); di ike, Joshua, nwa Jehozadak, bú onye-isi-nchu-àjà; di ike, unu ndi nile nke ala nka, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), luanu ọlu: n'ihi na Mu onwem nọyere unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova nke usu nile nke ndi-agha puta),
nēdegara Timọti akwukwọ, bú nwam nke m'huru n'anya: Amara na ebere na udo diri gi, nke si n'aka Chineke, bú Nna-ayi, na Kraist Jisus Onye-nwe-ayi puta.
Nání, di ike, nwe kwa ume nke-uku, ilezi anya ime dika iwu ahu nile si di, nke Moses, bú orùm, nyere gi n'iwu: ewezugala onwe-gi na ya n'aka-nri ma-ọbu n'aka-ekpe, ka i we nwe uche n'ebe ọ bula i nēje.
Ma nābanu uba n'amara na ọmuma nke Onye-nwe-ayi, bú Onye-nzọputa-ayi, Jisus Kraist. Ọ bu Ya ka otuto diri ma ub͕u a ma rue ubọchi nke mb͕e ebighi-ebi. Amen.