Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 1:4 - Bible Nso

4 n'ihi na agu ihu gi nāgusim ike abali na ehihie, ebe m'nēcheta anya-miri-gi nile, ka m'we juputa n'ọṅù;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

4 Ka m na-echeta anya mmiri gị, ọ na-agụsị m agụụ ike ehihie na abalị ịhụ gị, ka ọṅụ m zuo oke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 1:4
19 Iomraidhean Croise  

Ndi ji anya-miri agha nkpuru gēji iti-nkpu-ọṅù we ihe-ubi.


idoro ndi Zaion nēru újú, inye ha ihe ọma ike n'isi n'ọnọdu ntu, manu obi-utọ n'ọnọdu iru-újú, ákwà-nb͕okwasi otuto n'ọnọdu mọ nke inyoghi-inyoghi; ka enwe kpọ ha osisi oak nke ezi omume, ihe-ọkukú nke Jehova, ime ka ọ ma nma.


Mb͕e ahu ka nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke gāṅuri ọṅu n'otite-egwú, umu-okorọbia na ndi-okenye gāṅuri kwa ọṅu n'otù: n'ihi na M'gāb͕anwe oruru-újú-ha n'obi-utọ, kasi kwa ha obi, me ka ha si na nwuta-ha ṅuria ọṅu.


Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe-nwuta ub͕u a: ma M'gāhu unu ọzọ, obi-unu gāṅuri kwa ọṅu, ọ dighi kwa onye ọ bula gānara unu ọṅù-unu.


Rue ub͕u a unu akāriọghi ihe ọ bula n'aham: riọnu, unu gāriọta kwa, ka ọṅù-unu we zue oke.


otú m'buru orù Onye-nwe-ayi n'obi di ume-ala nile, na anya-miri, na ọnwunwa di iche iche nke dakwasirim n'ajọ ìzù nile nke ndi-Ju:


N'ihi ya nēchenu nche, ebe unu chetara na ogologo arọ atọ arapughm iwere anya-miri nādu madu nile n'otù n'otù ọdú abali na ehihie.


N'ihi na ihu unu anya nāgusim ike, ka m'kwe ka unu keta onyinye-amara ufọdu nke Mọ Nsọ, ka ewe me ka unu guzosie ike;


N'ihi na Chineke bu onye-àmà nkem, otú agu unu nile nāgusim ike n'obi-ebere nke Kraist Jisus.


ebe agu unu nile nāgusi ya ike, obi lọ-kwa-ra ya miri, n'ihi na unu nuru na aru-ya adighi ike:


Ma ayi onwe-ayi, umu-nna-ayi, ebe ekewapuru ayi n'aru-unu nwa oge ntà, n'iru, ọ bughi n'obi, ayi were oké agu nubiga ọku ókè n'obi kari ihu iru-unu:


Were inu-ọku-n'obi bia tutu mb͕e oyi erue. Yubulọs nēkele gi, ya na Pudins, na Lainọs, na Klọdia, na umu-nna-ayi nile.


Were inu-ọku-n'obi biakutem ọsọsọ:


ihe ndia ka ayi onwe-ayi nēde kwa n'akwukwọ, ka ewe mezue ọṅù-ayi.


Ọ gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha; ọnwu agaghi-adi kwa ọzọ; iru-újú ma-ọbu ikwa-ákwá ma-ọbu aru-ufu agaghi-adi kwa ọzọ: ihe ngbu nile agabigawo.


n'ihi na Nwa-aturu ahu Nke nọ n'etiti oche-eze ahu gāzù ha dika aturu, Ọ gēduru kwa ha ga n'isi-iyi nke miri nke ndu: Chineke gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n'anya-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan