Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 1:3 - Bible Nso

3 Anameleke Chineke, Onye m'nēkpere site na nnam ochie-hà n'akọ-na-uche di ọcha, otú nchetam bayere gi n'aririọm nile di n'ewepughi aka,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Ana m ekele Chineke, bụ onye m na-ejere ozi ekele, dị ka nna nna m ha mere site nʼakọnuche dị ọcha, ọtụtụ mgbe ka m na-echeta gị nʼekpere m ehihie na abalị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 1:3
21 Iomraidhean Croise  

o we nọdu n'ọnọdu nwanyi di-ya nwuru rue ọgu arọ anọ na anọ), onye nāpughi n'ulo Chineke, ma o were obubu-ọnu na aririọ nēkpere Chineke abali na ehihie.


Mu onwem bu onye-Ju, nke amuru na Tasọs nke Silisia, ma azùputaram n'obodo a, n'ukwu Gameliel, ezíwo mu ihe, dika esi edebezu iwu nke nna-ayi-hà, obim nānu ọku nye Chineke, dika unu onwe-unu nile di ta:


Pọl we legide nnọkọ-ikpé ahu anya, si Umu-nnam, mu onwem ewerewo ezi akọ-na-uche nile biri n'iru Chineke dika onye-Ju rue ubọchi ta.


Ma nka ka m'kwuputara gi, na dika Uzọ ahu si di nke ha nākpọ irọ-òtù, ọ bu otú a ka m'nēkpere Chineke nke nna-ayi-hà, ebe m'kwere ihe nile nke di ka iwu-ayi si di, nke edewo-kwa-ra n'akwukwọ ndi-amuma:


Nime nka ka m'nārughari kwa arum uka inwe akọ-na-uche nādighi-asu ngọngọ n'ebe Chineke na madu nọ mb͕e ọ bula.


Ya mere, ndi-Ju nile matara ibi-obim site na nwata, nke sitere na mbu di n'etiti mba nke akam, na nime Jerusalem;


N'ihi na mọ-ozi nke Chineke ahu Onye nwem, Onye m'nēkpe-kwa-ra guzorom nso n'abali a,


Anamekwu ezi-okwu nime Kraist, ekwughi m okwu-ugha, akọ-na-uchem nēsokwam b͕a àmà nime Mọ Nsọ,


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


anamaga-kwa-ri n'iru n'uzọ ndi-Ju kari ọtutu ndi-ọb͕ọm n'etiti mba nkem, ebe obim nānubigara ozizí ahu ọku ókè kari, bú nke nnam-hà nyere ayi n'aka idebe.


ewepughi m aka n'ikele ekele bayere unu, nēhotakwa unu n'ekperem;


abali na ehihie nāriọbiga aririọ ókè nke-uku ri nne ka ayi we hu iru-unu, dochi kwa ihe fọduru n'okwukwe-unu?


nēnwe okwukwe na ezi akọ-na-uche; nke ufọdu nupuru n'ebe ha nọ, ub͕ọ-ha we kpùe n'ebe okwukwe-ayi di:


Ma ihe ezubere iweta n'iwu ahu bu ihu-n'anya sitere n'obi ọcha na ezi akọ-na-uche na okwukwe nke iru-abua nādighi ya:


Ma nwanyi nke bu onye di-ya nwuru n'ezie, nke arapu-kwa-ra nání ya, ọ tukwasiwo obi-ya na Chineke, nānọgide kwa n'aririọ-ya na ekpere-ya abali na ehihie.


ebe emerem ka m'cheta okwukwe iru-abua nādighi ya nke di nime gi; bú okwukwe nke buru uzọ biri nime nne-gi ochie Lois na nne-gi Yunaisi; ma emerem ka m'kweye na o bi kwa nime gi.


ebe i ma-kwa-ra na i sitere n'oge i di na nwa ọhu mata ihe di nsọ nile edeworo n'akwukwọ nsọ nke puru ime ka i buru onye-amam-ihe inata nzọputa site n'okwukwe nke i kwere na Kraist Jisus.


Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi.


Mu onwem kwa, ya burum ihe-árú, bú ka m'mehie megide Jehova n'igha ikpe ekpere bayere unu: ma m'gēzí unu ihe n'uzọ ahu di nma nke ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan