Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 1:18 - Bible Nso

18 (ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

18 Ka Onyenwe anyị kwe ka ọ nata ebere nʼaka Onyenwe anyị nʼụbọchị ahụ. Ị mara nke ọma ụdị aka o nyere m nʼEfesọs.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 1:18
26 Iomraidhean Croise  

Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua?


Imere nna-ayi-hà ebere, Na icheta ọb͕ub͕a-ndu nsọ Ya;


N'ihi obi ebere nke Chineke-ayi, Nke ọwuwa-anyanwu nke sitere n'elu gēleta ayi nime ya,


na Joana nwunye Kuza onye Herod tiyere ihe-ya n'aka, na Susana, na ọtutu ndi ọzọ, ndi nēweputa ihe ha nwere ime ezi ha.


Ha we rue Efesọs, o we rapu ha n'ebe ahu: ma ya onwe-ya batara n'ulo-nzukọ-ha, we gwa ndi-Ju okwu.


ma mb͕e o kelesiri ha ekele ikpe-azu, si kwa, M'gālaghachikute unu ọzọ, ma Chineke kwe, o si n'Efesọs nupu ub͕ọ.


O we rue mb͕e Apọlos nọ na Kọrint, na Pọl, mb͕e ọ gabigasiri nime elu ala, ọ biaruru Efesọs, hu madu ufọdu ndi nēso uzọ Jisus:


Onye gēme kwa ka unu guzosie ike rue ọgwugwu ihe nile, buru ndi anāpughi ibo ebubo n'ubọchi Onye-nwe-ayi Jisus Kraist.


Ma m'gānọgide n'Efesọs rue oge Pentikọst;


agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu.


N'ihi na ọ dighi nkpà ka m'degara unu akwukwọ bayere ijere ndi nsọ ozi:


ma Chineke, ebe Ọ bu ọgaranya n'ebere, n'ihi oké ihunanya-Ya Ọ huru ayi,


N'ihi na gini bu olile-anya-ayi, ma-ọbu ọṅù-ayi, ma-ọbu okpu-eze nke inya-isi ayi? Ọ̀ bughi kwa unu onwe-unu, n'iru Onye-nwe-ayi Jisus n'ọbibia-Ya?


Dika m'riọrọ gi ka i nọgide n'Efesọs, mb͕e m'gaje iga nime Masedọnia, ka i we nye madu ufọdu iwu ka ha ghara izí ihe di iche,


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya;


kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n'obi chọbam, we chọtam


Ma ezigaram Tikikọs n'Efesọs.


nke fọduru bu na edebeworom okpu-eze nke ezi omume ahu, nke Onye-nwe-ayi, bú Onye ezi omume n'ikpe ikpé, gēnyeghachim n'ubọchi ahu: ma ọ bughi nání mu onwem, kama Ọ gēnyeghachi kwa ndi nile huworo ngosi-Ya n'anya.


n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.


Ọ bu kwa nzọputa nka ka ndi-amuma chọrọ, nyocha kwa ihe bayere ya, bú ndi buru amuma bayere amara ahu nke gēru unu:


Degara mọ-ozi nke nzukọ Kraist di n'Efesọs akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọ nēkwu, bú Onye nēji kpakpando asa ahu n'aka-nri-Ya, Onye nējeghari n'etiti ihe-idọba-oriọna asa ahu nke eji ọla-edo me:


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan