Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Timoti 1:16 - Bible Nso

16 Ka Onye-nwe-ayi mere èzí-na-ulo Ọnisifọrọs ebere: n'ihi na o mere ka m'nwe ume ndu ọtutu mb͕e, ihere nkpọrọm emeghi kwa ya;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Ka Onyenwe anyị mere ezinaụlọ Onisiferọs ebere, nʼihi ume ọ gbara m ọtụtụ mgbe. Ihere emeghị ya na-abụ m onye mkpọrọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Timoti 1:16
27 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a Jehova mere unu ebere na ezi-okwu: ọzọ kwa, mu onwem gēmeghachiri unu ezi ihe a, n'ihi na unu emewo ihe a.


Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.


M'we si ndi Livai ka ha nēme onwe-ha ka ha di ọcha, ka ha nābia kwa nēche ọnu-uzọ-ama nile, ido ubọchi-izu-ike nsọ. Chinekem, cheta-kwa-ram ihe a, me-kwa-ram ebere, dika, iba-uba nke ebere-Gi si di.


na inara onyinye iji biaru nso, bú nkú, na mb͕e ezubere, na inara nkpuru mbu. Chinekem, chetam, imerem ezi ihe.


Chinekem, chetaram ihe nile nke m'meworo n'ihi ndi nka, imerem ezi ihe.


N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè;


Ogologo ubọchi nile ka ọ nēme amara, nēbinye kwa ihe; Nkpuru-ya bu kwa ndi agọziri agọzi.


Ma M'gānaputa gi ubọchi ahu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta): agaghi-enye kwa gi n'aka ndi ahu gi onwe-gi nātu egwu ha.


Otú ahu onye nara talent abua ahu rita-kwa-ra talent abua ọzọ.


Ngọzi nādiri ndi-ebere: n'ihi na ndi ahu ka agēmere ebere.


Mb͕e ahu onye-isi-ọchi-agha biaruru nso, jide ya, si ka ewere nkpọrọ abua ke ya; ọ ju-kwa-ra onye ọ bu, na ihe o mereri.


Ya mere n'ihi ihe nka ka m'riọrọ unu ka m'hu unu anya gwa kwa unu okwu: n'ihi na ọ bu n'ihi olile-anya nke Israel ka ekerem nkpọrọ a


N'ihi na ha mere ka mọ nkem na nke unu zuru ike: ya mere mazunu madu di otú a.


nke m'bu ukọ̀ nime nkpọrọ n'ihi ya; ka m'we kwuwa okwu nime ya, dika m'nāghaghi ikwu.


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


kama, mb͕e ọ biaruru Rom, o were inu-ọku-n'obi chọbam, we chọtam


(ka Onye-nwe-ayi nye ya ka ọ chọta ebere n'aka Onye-nwe-ayi n'ubọchi ahu); ka ha ra kwa, bú ihe o ji jere m ozi n'Efesọs, gi onwe-gi jere karia.


Ya mere ka ihere àmà nke Onye-nwe-ayi, ma-ọbu ihere nke mu onye-nkpọrọ-Ya, ghara ime gi: kama so ozi ọma Ya hujukọ anya dika ike nke Chineke si di;


Kele Priska na Akwila, na èzí-na-ulo Ọnisifọrọs.


E, nwa-nnam, kwe ka mu onwem nwe obi-utọ n'aru gi nime Onye-nwe-ayi: me ka obim zuru ike nime Kraist.


N'ihi na enwerem ọtutu ọṅù na nkasi-obi n'ihi ihu-n'anya-gi, n'ihi na obi ndi nsọ ezuwo ike site n'aka-gi, nwa-nnam.


N'ihi na unu ji obi so ndi nọ n'ab͕u hukọ ahuhu, unu were kwa ọṅù nara npunara ahu nke-ọma, bú nke apunara unu ihe nile unu nwere, ebe unu mara na unu nwere onwe-unu dika ihe unu nwere, bú ihe ka nma nke nādigide kwa.


n'ihi na Chineke abughi onye ajọ omume ichezọ ọlu-unu na ihu-n'anya ahu unu gosiri n'ebe aha-Ya di, ebe unu jere ndi nsọ ozi, nēje-kwa-ra ha ozi.


Naomi we si nwunye abua nke umu-ya, Jenu, laghachi, nwayi ọ bula n>ulo nne-ya: Jehova mere unu ebere, dika unu mere ndi nwuru anwu, me-kwa-ra mu onwem.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan