Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 8:3 - Bible Nso

3 Devid tib͕u-kwa-ra Hedadeza nwa Rehob, bú eze Zoba, mb͕e ọ nēje iweghachi ike-ya n'akuku Osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Devid merikwara Hadadeza nwa Rehob, eze Zoba. Mgbe ọ gara inweghachita ogidi e jiri mara ya, nʼakụkụ osimiri Yufretis.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 8:3
15 Iomraidhean Croise  

N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis:


Siria we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we chikọta onwe-ha n'otù.


Hedareza we ziga, me ka Siria ndi nọ n'ofè Osimiri puta: ha we biarue Hilam, Shobak onye-isi usu-ndi-agha Hedareza je-kwa-ra n'iru ha.


Eze nile, bú ndi-orù Hedareza, we hu na etib͕uru ha n'iru Israel, ha we me ka ha onwe-ha na Israel di n'udo, we fè ha òfufè. Siria we tua egwu izọputa umu Amon ọzọ.


Umu Amon we hu na ha nēsì Devid ísì ọjọ, umu Amon we ziga, go Siria Bet-rehob na Siria Zoba, orú nnù ndikom uzọ abua na nnù iri ndi ji ukwu eje, na eze Meaka, ya na nnù ndikom abua na ọgu iri, na ndikom Tob, bú orú nnù ndikom na nnù iri.


Igal nwa Netan nke Zoba, Bani onye Gad;


Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.


Devid tib͕u-kwa-ra Hedareza, bú eze Zoba, rue Hemat, mb͕e o nēje ime ka ike-ya guzo n'akuku osimiri Yufretis.


Solomon we jerue Hemat-zoba, were ya.


Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.


Ya nwe kwa ike n'aru madu site n'otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, Site kwa n'Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.


M'gētiye kwa ókè-ala-gi site n'Oké Osimiri Uhie we rue oké osimiri ndi Filistia, site kwa n'ọzara rue Osimiri Yufretis: n'ihi na M'gēwere ndi bi n'ala ahu nye n'aka-unu; i gāchupu kwa ha n'iru gi.


Ebe ọ bula nke ọbu-ukwu-unu gāzọkwasi ka unu gēnwe: site n'ọzara, na Lebanon, site n'osimiri ahu, bú osimiri Yufretis, we rue oké osimiri nke di n'azu, gābu ókè-ala unu.


Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan