Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 8:2 - Bible Nso

2 O tib͕u-kwa-ra Moab, were udọ̀-ọtùtù tùa ha, me ha ka ha dina ala; o we tùa udọ̀-ọtùtù abua ime ka ha nwua, na udọ̀ ọtùtù zuru ezu ime ka ha di ndu. Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Devid merikwara ndị Moab. O mere ka ha dinaa nʼala. O jikwa ụdọ ọtụtụ tụa ha. Ọtụtụ abụọ ọbụla nʼime ha ka egburu. Ọtụtụ nke atọ ka a hapụrụ ka ha dịrị ndụ. Ya mere, ndị Moab ghọrọ ndị ohu Devid, na-ebutakwara ya ụtụ kwa afọ ọbụla.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 8:2
22 Iomraidhean Croise  

O me-kwa-ra ka ndi nọ nime ya puta, o tiye ha n'okpuru mma-nkwọ, na n'okpuru ígwè nēbì ihe, na n'okpuru anyu-ike ígwè, me kwa ka ha gabiga n'ihe eji akpu brick: otú a ka ọ nēme kwa obodo nile nke umu Amon. Devid na ndi Israel nile we lata na Jerusalem.


Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


Solomon we nāchi ala-eze nile site n'Osimiri rue ala ndi Filistia, ru kwa ókè-ala Ijipt: ha nēweta nso onyinye-inata-iru-ọma, nēfè kwa Solomon òfùfè ubọchi nile nke ndu-ya.


Moab we jehie megide Israel mb͕e ọnwu Ehab gasiri.


Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.


O tib͕u-kwa-ra Moab; Moab we ghọrọ Devid ndi-orù, nēbute onyinye-inata-iru-ọma.


Ndi Amon we nye Uzaia onyinye-inata-iru-ọma: aha-ya we rue nbata Ijipt; n'ihi na o mere onwe-ya ka ọ di ike ri nne.


Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: N'aru Filsitia ka m'gēti nkpu.


Ndi ala ọzọ nāta aru, Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta.


Ọ̀ bughi Gi onwe-gi, Chineke, juworo ayi aju? I dighi-apu kwa ije agha n'etiti usu nile nke ndi-agha ayi, Chineke.


Moab bu ite ọsisa-arum; N'elu Edom ka m'gātu akpukpọ-ukwum: Filistia, tie nkpu n'ihim.


Ulo-ikwū nile nke Edom na ndi Ishmael; Moab na ndi Haga;


Unu egela Hezekaia nti: n'ihi na otú a ka eze Asiria siri, Merenum ihe-ngọzi, pukutekwam; ri-kwa-nu, nwoke ọ bula nkpuru vine-ya, na nwoke ọ bula nkpuru osisi fig ya, ṅu-kwa-nu, nwoke ọ bula miri olùlù-miri-ya:


Anamahu ya, ma ọ bughi ub͕u a: Anamekiri ya, ma ọ bughi na nso: Otù kpakpando gēsi na Jekob zọlie ije, Nkpa-n'aka eze gēsi kwa n'Israel bilie, We mapue akuku nile nke Moab, Gwuda kwa umu ọkpukpọ-ùzù nile,


Ma ufọdu ndi jọb͕uru onwe-ha siri, Onye a, ò gēsi aṅa zọputa ayi? Ha we lelia ya, ha ewetaghi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma. O we di ka onye nti chiri.


Ma Sọl were ala-eze ahu, buru eze Israel, o we bue agha megide ndi-iro-ya nile buruburu, megide Moab, megide kwa umu Amon, megide kwa Edom, megide kwa ndi-eze Zoba, megide kwa ndi Filistia: ma n'ebe ọ bula ọ nēcheghari iru ọ nālub͕u ha.


Devid we si n'ebe ahu je rue Mizpe Moab: ọ si eze Moab, Biko, ka nnam na nnem puta, nọ n'etiti unu, rue mb͕e m'mara ihe Chineke gēmerem.


O we duru ha bia n'iru eze Moab: ha we biri n'aka-ya ubọchi nile Devid nọ n'ebe ahu ewusiri ike.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan