Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 8:14 - Bible Nso

14 O tiye-kwa-ra ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom: n'Edom nile ka o tiyere ebe-nguzo-ndi-agha, Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula ọ jere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 O wuru ogige ndị agha nʼala Edọm niile, ndị Edọm niile ghọrọ ndị na-ejere Devid ozi. Onyenwe anyị nyere Devid mmeri ebe ọbụla ọ gara.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 8:14
18 Iomraidhean Croise  

Jehova we si ya, Mba abua di n'afọ-gi, Agēkewa kwa mba abua site n'úkwù-gi; Otù mba gēnwe ume kari mba ibe-ya; Nke-okenye gēfè nke-ntà.


Ka ndi di iche iche fè gi, Ka mba di iche iche kpọ isi ala nye gi: Buru onye nwere ike n'aru umunne-gi, Ka umu nke nne-gi kpọ kwa isi ala nye gi: Ka onye ọ bula nke nābu gi ọnu buru onye anābu ọnu, Ka onye ọ bula nke nāgọzi gi buru kwa onye agọziri agọzi.


Devid we nāga n'iru, nēje nādi uku; Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, nọye-kwa-ra ya.


M'we nọyere gi n'ebe ọ bula i jere, ebipu-kwa-ram ndi-iro-gi nile n'iru gi; M'gēme-kwa-ra gi aha uku, dika aha ndi uku ndi nọ n'uwa.


Devid we buru eze Israel nile; Devid we nēmere ndi-ya nile ihe ekpere n'ikpe na ezi omume.


Devid we tiye ebe-nguzo-ndi-agha nime Siria Damaskọs: Siria we ghọrọ Devid ndi-orú, nēbute onyinye-inata-iru-ọma. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


O rue, mb͕e Devid nọ n'Edom, mb͕e Joab, bú onye-isi usu-ndi-agha, rigoro ilì ndi eb͕uru eb͕u, na o tib͕uru nwoke ọ bula n'Edom;


Ma eze adighi n'Edom: onye edoro onye-isi bu eze.


Jehoshafat mere ub͕ọ Tashish ijeru Ofia ibute ọla-edo: ma ha ejeghi; n'ihi na etiwara ub͕ọ ahu n'Ezion-geba.


Ya onwe-ya tib͕uru Edom nime Ndagwurugwu Nnú, orú nnù ndikom na nnù ise, were kwa Sela n'agha, kpọ aha-ya Jokteel, rue ta.


Jehova nọye-kwa-ra ya; n'ebe o bula ọ nāpu o nwere uche: o we nupu isi n'okpuru eze Asiria, o fèghi kwa ya òfùfè.


O we tiye ebe-nguzo-ndi-agha n'Edom; Edom nile we ghọrọ Devid ndi-orù. Jehova we nāzọputa Devid ebe ọ bula o jere.


Chineke, I juwo ayi aju, I tiwawo ayi, I wewo iwe; I gēme ka ayi laghachi ọzọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan