Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 7:25 - Bible Nso

25 Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke, okwu ahu nke I kwuworo bayere orù-Gi, baye-kwa-ra ulo-ya, me ya ka o guzosie ike rue mb͕e ebighi-ebi, Gi me kwa dika I kwuworo.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Ugbu a, Onyenwe anyị Chineke, debe nkwa a nke i kwere banyere ohu gị na ụlọ ya ka ọ dịrị ruo mgbe ebighị ebi. Mezukwaa ihe niile dịka nkwa gị si dị

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 7:25
11 Iomraidhean Croise  

Ma Gi onwe-gi siri, Aghaghm ime gi nma, M'gēme kwa nkpuru-gi ka ọ di ka ájá nke oké osimiri, nke anāpughi iguta ọnu n'ihi ọtutu ọ di.


I we me ndi-Gi, bú Israel, ka o guzosiere Gi ike, iburu Gi otù ndi rue mb͕e ebighi-ebi; Gi onwe-gi, Jehova, we ghọrọ ha Chineke.


Ka aha-Gi di kwa uku rue mb͕e ebighi-ebi, si, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu Chineke Israel: agēme kwa ka ulo orù-Gi, bú Devid, guzosie ike n'iru Gi.


ka Jehova we me ka okwu-Ya guzosie ike nke O kwuru bayerem, si, Ọ buru na umu-gi elezie uzọ-ha anya, ijeghari n'irum n'ezi-okwu n'obi-ha nile na na nkpuru-obi-ha nile, agaghi-ebipu n'ulo-gi onye nwe inọdu n'oche-eze Israel, ka O kwuru.


Ma ub͕u a, Chineke Israel, biko, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid nnam.


Ma ub͕u a, Jehova, bú Chineke Israel, ka okwu-Gi kwesi ntukwasi-obi, nke I gwara orù-Gi, bú Devid.


Me ka okwu-ọnu-Gi guzosiere orù-Gi ike, Bú nke diri egwu-Gi.


Cheta okwu I gwara orù-Gi, Nke I meworom ka m'chere.


Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọzọ, nka ka M'gēkwe ka ulo Israel juam ase bayere ya, ka M'we mere ha ya; M'gēme ka ha ba uba na madu dika ìgwè ewu na aturu.


Elkena, bú di-ya, we si ya, Me ihe di nma n'anya-gi; nọdu rue mb͕e i meworo ka ọ rapu ara; nání ka Jehova me ka okwu-Ya guzosie ike. Nwayi ahu we nọdu, nye nwa-ya ara, rue mb͕e o mere ka ọ rapu ara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan