Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 7:1 - Bible Nso

1 O rue, mb͕e eze biri n'ulo-ya, mb͕e Jehova me-kwa-ra ka o zuru ike pua n'aka ndi-iro-ya nile buruburu,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 O ruo mgbe eze nọsara ahụ nʼụlọeze ya, mgbe Onyenwe anyị mekwara ka o site nʼaka ndị iro ya nọ gburugburu zuru ike,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 7:1
19 Iomraidhean Croise  

Hairam, bú eze Taia, we zigara Devid ndi-ozi, na osisi cedar, na ndi-ọ̀kà n'osisi, na ndi-ọ̀kà na nkume: ha we wuere Devid ulo.


Ma Maikal, bú nwa-nwayi Sọl, o nweghi nwa rue ubọchi ọnwu-ya.


na dika site n'ubọchi mb͕e M'nyere ndi-ikpe iwu ibu ndi-isi ndim, bú Israel; emewokwam ka i zuru ike pua n'aka ndi-iro-gi nile. Jehova egosiwo kwa gi na Jehova gēmere gi ulo.


Ma ub͕u a Jehova, bú Chinekem, emewo ka m'zuru ike buruburu; ọ dighi onye-nmegide, ọ dighi kwa ihe ọjọ daputara ayi.


O we kpọ Solomon, bú nwa-ya, nye ya iwu iwuru Jehova, bú Chineke Israel, ulo.


Devid we si Solomon nwa-ya, Mu onwem, ọ di n'obim iwuru aha Jehova, bú Chinekem, ulo.


Devid, bú eze, we guzo ọtọ n'ukwu-ya abua, si, Nurunum, umu-nnem, na ndim: mu onwem, ọ di n'obim iwuru ib͕e ọb͕ub͕a-ndu Jehova ulo izu-ike, nke gābu kwa ihe-nb͕akwasi-ukwu Chineke-ayi; m'we dozie ihe iji ewu ulo.


O we wue obodo ewusiri ike nime Juda: n'ihi na ala di jū, ọ dighi kwa agha o nwere n'arọ ndia; n'ihi na Jehova mere ka o zuru ike.


Ala-eze Jehoshafat we di jū: n'ihi na Chineke-ya mere ka o zuru ike buruburu.


Rue mb͕e m'gāchọtara Jehova ọnọdu, Chọtara Dike nke Jekob ebe-obibi.


Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.


Mb͕e uzọ nile nke onye ọ bula nātọ Jehova utọ, Ọ nēme ọbuná ndi-iro-ya ka ha na ya di n'udo.


Ngwa ngwa onye nara talent ise ahu gara were ha zua ahia, we rita urù talent ise ọzọ.


onye huru amara n'iru Chineke, we riọ ichọtara Chineke nke Jekob ebe-obibi.


Jehova we me ka ha zuru ike buruburu, dika ihe nile si di nke Ọ ṅuru ndi bu nna-ha iyi: ọ dighi kwa nwoke ọ bula n'etiti ndi-iro-ha nile guzoro n'iru ha; ndi-iro-ha nile ka Jehova nyere n'aka-ha.


O rue, mb͕e ọtutu ubọchi gasiri site na mb͕e Jehova mere ka Israel zuru ike pua n'aka ndi-iro-ha nile buruburu, mb͕e Joshua ghọrọ agadi, mb͕e ubọchi ndu-ya nāgwu,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan