Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 6:7 - Bible Nso

7 Iwe Jehova we di ọku megide Uza; Chineke we tib͕ue ya n'ebe ahu n'ihi nmehie-ya; o we nwua n'ebe ahu n'akuku ib͕e Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma iwe Onyenwe anyị dị ọkụ megide Ụza, nʼihi omume enweghị nsọpụrụ o mere. Ya mere, Chineke tigburu ya. Ọ nwụọ nʼebe ahụ nʼakụkụ igbe Chineke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 6:7
10 Iomraidhean Croise  

Iwe Devid we di ọku n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: ọ we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta.


Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke.


N'ihi na ọ bughi unu onwe-unu būru ya na mbu, n'ihi ya ka Jehova, bú Chineke-ayi, tiwaputara megide ayi, n'ihi na ayi achọghi Ya dika ikpé-Ya si di.


Mb͕e ahu Devid siri, Ọ dighi onye gēbu ib͕e Chineke ma-ọbughi ndi Livai: n'ihi na ha ka Jehova rọputaworo ibū ib͕e Chineke, na ijere Ya ozi rue mb͕e ebighi-ebi.


Ma na nbuli-ije nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēweda ya: ọzọ, n'ọmuma nke ebe-obibi ahu, ndi Livai gēguzo ya ọtọ: ma onye ala ọzọ nke nābiaru nso, agēme ka ọ nwua.


Ma mb͕e Eron na umu-ya ndikom kpuchisiri ebe nsọ ahu, na ihe nile nke ebe nsọ ahu, nime nbuli-ije nke ọmuma-ulo-ikwū; emesia, umu Kohat gābia ibū ya: ma ha agaghi-emetu ebe nsọ ahu aka, ha we ghara inwu. Ihe ndia bu ibu umu Kohat n'ulo-ikwū nzute.


O rue, mb͕e ihe ra ka ubọchi iri gabigara, na Jehova tib͕uru Nebal, o we nwua.


O we tib͕ue ufọdu nime ndikom Bet-shemesh, n'ihi na ha lere anya nime ib͕e Jehova, O we tib͕ue n'etiti ndi Israel ọgu ndikom atọ na iri, orú nnù ndikom uzọ isi na nnù ise: ndi Israel we rue újú, n'ihi na Jehova tib͕uru ntib͕u uku n'etiti ndi Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan