Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 4:8 - Bible Nso

8 Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ha buuru isi Ishboshet butere Devid na Hebrọn, sị eze, “Taa ka Onyenwe anyị bọọrọ onyenwe m eze ọbọ megide Sọl na mkpụrụ ya. Nke a bụ isi Ishboshet, nwa onye iro gị Sọl, onye chọsịrị ike iwepụ ndụ gị.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 4:8
18 Iomraidhean Croise  

Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.


Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi.


Ma Abnea nwa Nea, bú onye-isi usu-ndi-agha Sọl nwere, kuru Ish-boshet nwa Sọl, me ka ọ gabiga rue Mahanaim;


Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,


Ọzọ, irem ganēkwu okwu, dika onye nātughari uche, bayere ezi omume-Gi ogologo ubọchi nile: N'ihi na ihere emewo ha, n'ihi na ha nwere iru-ihere, bú ndi nāchọ imem ihe ọjọ.


si, Bilie, kuru Nwatakiri ahu na nne-Ya, ga ala Israel: n'ihi na ndi nāchọ ndu Nwatakiri ahu anwuwo.


Ka obi nātọ gi utọ n'isi ya, gi elu-igwe, na unu ndi nsọ, na unu ndi-ozi, na unu ndi-amuma; n'ihi na Chineke kpere ikpé-unu n'aru ya.


ha we were oké olu tie nkpu, si, Rùe ole mb͕e, Onye-nwe-ayi, Onye di nsọ, buru kwa Onye-ezi-okwu, ka I nēkpeghi ikpé bọ̀ kwa ọ́bọ̀ ọbara-ayi n'isi ndi bi n'elu uwa?


Sọl we tua ube ahu; ọ si, M'gātugide Devid ọbuná na mb͕idi. Devid we chigharia onwe-ya si n'iru ya pua ub͕ò abua.


Sọl we gwa Jonatan nwa-ya na ndi-orù-ya nile okwu, ka ha me ka Devid nwua.


Sọl we ziga ndi-ozi ahu ihu Devid, si, Bugotaram ya n'ihe-ndina-ya, ka m'we me ka ọ nwua.


Devid we si na Naiot nime Rema b͕alaga, ọ bia kwue n'iru Jonatan, si, Gini ka m'meworo? gini bu ajọ omumem? gini bu kwa nmehiem n'iru nna-gi, na ọ nāchọ ndum?


Devid we hu na Sọl aputawo ichọ ndu-ya: ma Devid nọ n'ọzara Zif n'oké ọhia.


Ndikom Devid we si ya, Le, ubọchi nke Jehova siri gi, Le, Mu onwem nēnye onye-iro-gi n'aka-gi, i gēme kwa ya dika o si di nma n'anya-gi. Devid we bilie, were nzuzo bipu ọnu-ọnu uwe-nwuda nke Sọl nwere.


Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan