Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 4:6 - Bible Nso

6 Ma n'ebe ahu ka ha biara rue etiti ulo, dika ha nēwere ọka wheat; ha we tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise: Rikab na Beana, bú nwa-nne-ya, we wepuga onwe-ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ha banyere nʼime ime ụlọ, dịka a ga-asị na ha na-aga iburu ọka wiiti. Mgbe ha banyere nʼebe ahụ, ha mara Ishboshet mma nʼafọ. Emesịa, Rekab na nwanne ya Baana si nʼụlọ ahụ zopu onwe ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 4:6
5 Iomraidhean Croise  

Ma ọ juru iwezuga onwe-ya: Abnea we were isi ube-ya tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise, ube we puta n'azu ya, o we da n'ebe ahu, nwua n'okpuru ya: o rue, na ndi nile ndi biaruru ebe ahu, bú ebe Asahel dara nwua, guzoro.


Ma Amasa elezighi anya na mma-agha nke di n'aka Joab: o we were ya tie ya n'okpuru ọgiriga nke-ise, wusi ngiri-afọ-ya n'ala, ma o tighi kwa ya ọzọ; o we nwua. Joab na Abishai, bú nwa-nne-ya, we chua Sheba nwa Bikri n'azu.


Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Ma Ish-boshet nwa Sọl nwere ndikom abua ndi bu ndi-isi usu ndi nāpunara madu ihe: aha otù bu Beana, aha nke-ọzọ bú Rikab, ha bu umu Rimon onye Beirot, sitere n'umu Benjamin: (n'ihi na anāgu-kwa-ra Benjamin, Beirot:


Ihud we wepuga onwe-ya mb͕e ọ nāb͕agwoju ha anya, ya onwe-ya we gabiga arusi ahu apiri api, wepuga onwe-ya rue Seira.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan