Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 4:11 - Bible Nso

11 M'gēsi aṅa ghara ime kari otúa, mb͕e ndikom ndi nēmebi iwu b͕uworo onye ezi omume n'ulo-ya n'elu ihe-ndina-ya? Ma ub͕u a m'gaghi-ajuta ọbara-ya n'aka-unu kpochapu unu n'uwa?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

11 Ọ bụladị karịa nke a, mgbe ndị ikom ajọ omume gburu nwoke onye aka ya dị ọcha nʼụlọ ya, nʼelu ihe ndina ya? M ga-ahapụ ịbọtara onye e gburu egbu ọbọ, si otu a kpochapụ unu nʼụwa!”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 4:11
19 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, onye anābu ọnu ka i bu site n'ala, nke saghere ọnu-ya inara ọbara nwa-nne-gi n'aka-gi;


Chineke we si Noa, Ọgwugwu anu-aru nile abiawo n'irum; n'ihi na uwa juputara n'ihe-ike site na ha; ma, le, M'gēbibi ha na uwa.


O we kpochapu ihe nile ọ bula di ndu nke di n'elu ala, ma madu, ma anumanu, ma ihe nākpu akpu, ma anu-ufe nke elu-igwe: ewe kpochapu ha n'uwa: ọ we fọdu nání Noa na ndi ya na ha nọ n'ub͕ọ ahu.


Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.


Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.


Ma mu onwem akaghi aru ta, ọ bu ezie na abum onye etere manu ibu eze; ndikom ndia, bú umu Zeruaia, di kwa ike karim: Jehova kwughachi onye nēme ihe ọjọ dika ihe ọjọ ya si di.


Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


Ka ha di n'iru Jehova mb͕e nile, Ka O we bipu ncheta-ha n'uwa.


N'ihi na Onye nājuta ọbara ndi eb͕uru eb͕u echetawo ha: O chezọghi iti-nkpu nke ndi ewedara n'ala.


Onye nētib͕u madu, ọ we nwua, aghaghi ime ka ọ nwua.


N'ihi na ub͕u a M'gēsetipuwori akam, were ajọ ọria nēfe efe tib͕u gi na ndi-gi, ewe zopu gi n'uwa:


Ma ndi nēmebi iwu ka agēbipu n'uwa, Ọ bu kwa ndi nāghọ aghughọ ka agēropu na ya.


Isi-iyi azọtọrọ azọtọ na ebe-nsuputa-miri bibiri ebibi Ka onye ezi omume nke anēwezuga n'ọnọdu-ya n'iru onye nēmebi iwu bu.


Otú a ka unu gāsi ha, Chi nile nke nēmeghi elu-igwe na uwa, ha gāla n'iyì pua n'uwa na n'okpuru elu-igwe, bú chi ndia.


Ọ̀ bughi Gi onwe-gi siteworo na mb͕e ochie, Jehova, bú Chinekem, Onye Nsọm? ayi agaghi-anwu. Jehova, ọ bu ikpe ikpe ka I doworo ya; Gi Oké Nkume, ọ bu kwa iba nba ka I tọworo ya ntọ-ala.


N'ihi nka ka iwu nēsinwu, ikpe ziri ezi adighi-aputa kwa rue mb͕e ebighi-ebi: n'ihi na onye nēmebi iwu nāb͕a onye ezi omume buruburu; n'ihi nka ka ikpé nāputa buru ihe b͕agọrọ ab͕agọ.


ọ bughi dika Ken si buru onye si n'ajọ onye ahu puta, we b͕ue nwa-nne-ya. Ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka o b͕uru ya? N'ihi na ọlu-ya jọrọ njọ, ma ọlu nke nwa-nne-ya ziri ezi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan