Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 3:33 - Bible Nso

33 Eze we bùara Abnea abù-ákwà, si, Ọ̀ bu dika onye-nzuzu nānwu ka Abnea gānwu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Eze bụrụ abụ akwa nʼihi Abna, sị, “O kwesiri ka Abna nwụọ dịka onye nzuzu?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 3:33
10 Iomraidhean Croise  

Devid we were abù-ákwá nka bùara Sọl, bù-kwa-ra Jonatan nwa-ya:


Ekeghi aka-gi abua ab͕u, emeghi kwa ka ukwu-gi abua biarue nso ihe ọla eji ke ukwu ab͕u: Dika onye nāda n'iru ndi ajọ omume, otú a ka i dara. Ndi Israel nile we kwara ya ákwá ọzọ.


Jeremaia we bùara Josaia abù-ákwá: ndi-abù ndikom na ndi-abù ndinyom nile we nēkwu okwu bayere Josaia rue ta n'abù-ákwá-ha; ha we tiye ha ibu ukpuru n'ebe Israel nọ: ma, le, edewo ha n'akwukwọ abù-ákwá.


Ọnu onye-nzuzu buru ya nbibi, Eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu kwa ọnyà nkpuru-obi-ya.


Dika ọkwa nke nēkpokọba umu nke ọ nāmughi, otú a ka onye nākpa àkù, ma ọ kpaghi ya n'ikpé ziri ezi, si di; n'etiti ubọchi ndu-ya ọ gārapu ya, n'ikpe-azu-ya o we buru onye-nzuzu.


Abù-ákwá ka nka bu, nke ha gābù; umu-ndinyom nke mba nile gābù ya: n'ihi Ijipt na n'ihi ìgwè-ya nile ka ha gābù ya; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan