Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 3:3 - Bible Nso

3 nwa-ya nwoke nke-abua bu Kileab, nke Abigail nwunye Nebal, bú onye Kamel, muru; nke-atọ bu Absolom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua;

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Nke abụọ bụ Kiliab, nke Abigel, nwunye ochie Nebal, onye Kamel mụrụ. Nke atọ bụ Absalọm, nke Maaka nwa nwanyị Talmai, bụ eze Geshua mụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 3:3
22 Iomraidhean Croise  

O rue, mb͕e nka gasiri, na Absalom nwa Devid nwere nwa-nne-nwayi mara nma, aha-ya bu Tema; Amnon nwa Devid we hu ya n'anya.


Joab we bilie je Geshua, me ka Absalom bia ba na Jerusalem.


Eze we si, Ka o chigharia la n'ulo-ya, ma ọ gaghi-ahu irum anya. Absalom we chigharia la n'ulo-ya, ma ọ hughi iru eze.


Absalom we si Joab, Le, eziterem i ozi, si, Bia n'ebe a, ka m'ziga kwa gi jekuru eze, si N'ìhi gini ka m'siworo na Geshua bia? ọ gādim nma ma asi na mu onwem anọdu n'ebe ahu rue ub͕u a: ma ub͕u a ka m'hu iru eze; ọ buru kwa na ajọ omume adi nimem, ya me ka m'nwua.


O rue, n'ọgwugwu ọgu arọ abua, na Absalom siri eze, Biko, ka m'je kwughachi nkwam, nke, m'kwere Jehova, nime Hebron.


N'ihi na orù-gi kwere nkwa mb͕e m'biri na Geshua nime Siria, si, Ọ buru na Jehova eme ka m'laghachi na Jerusalem n'ezie, m'gēfè kwa Jehova òfùfè.


Eze we ma jijiji nke-uku, rigo rue ulo-elu nke ọnu-uzọ-ama, kwa ákwá: ma otú a ka o siri mb͕e ọ nēje, Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ̄ nma ma asi na mu onwem anwuwo n'ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!


Devid we rigo n'ebe ahu, ya na ndinyom-ya abua kwa, bú Ahinoam nwayi Jezreel, na Abigail, bú nwunye Nebal onye Kamel.


Ma ọ dighi mb͕e nna-ya mere ihe nēwuta ya n'ubọchi ndu-ya nile, si, Gini mere i meworo otú a? ọzọ kwa, onye ahu bu onye di nma n'aru nke-ukwu; nne-ya mu-kwa-ra ya mb͕e amusiri Absalom.


Ọ si, Gi onwe-gi amawo na ọ bu mu nwe ala-eze, ọ bu kwa mu ka Israel nile doro iru-ha, ka m'buru eze: ma ala-eze chighariri, we ghọ ihe diri nwa-nnem: n'ihi na o sitere n'aka Jehova diri ya.


Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel;


nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit;


Jaia nwa Manase were akuku Agob nile, rue ókè-ala ndi Geshua na ndi Meakat; ọ we kpọ ha Beshan-havot-jaia, n'aha-ya, rue ta.)


Ma umu Israel anapughi ndi Geshua na ndi Meakat ala-ha: Geshua na Meakat we biri n'etiti umu Israel, rue ta.


Ma aha nwoke ahu bu Nebal; aha nwunye-ya bu Abigail: nwayi ahu nwere ezi uche, ma kwa nma n'aru: ma nwoke ahu siri ike n'obi, jọ kwa njọ n'omume nile; ya onwe-ya bu kwa onye Keleb.


Abigail we me ngwa, bilie, nọkwasi n'inyinya-ibu, ya na umu-ab͕ọghọ-ya ise ndi nējeso ya n'ukwu n'ukwu; o we nējeso ndi-ozi Devid n'azu, ghọrọ ya nwunye.


Devid na ndikom-ya we rigo, made imegide ndi Geshua, na ndi-Giazait, na ndi Amalek: n'ihi na ndi ahu bu ndi bi n'ala ahu, ndi sitere na mb͕e ebighi-ebi gara aga, ebe i nābà na Shua, we rue n'ala Ijipt.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan