Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 3:29 - Bible Nso

29 ka ọ dakwasi n'isi Joab, na n'ulo nna-ya nile; ka aghara kwa ibipu n'ulo Joab onye nwere orùrù n'anu-aru-ya, ma-ọbu onye-ekpenta, ma-ọbu onye nādabere na nkpa-n'aka, ma-ọbu onye nāda site na mma-agha, ma-ọbu onye nri kọrọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Ka ikpe ọmụma a dakwasị Joab nʼisi, nakwa ezinaụlọ nna ya niile, ka a gharakwa ịhụ nʼụlọ Joab onye na-adịghị arịa ọrịa ahụ ihe ntokasị, maọbụ ọrịa ekpenta, maọbụ onye ji mkpara eji akpa akwa, maọbụ onye ga-anwụ site na mma agha, maọbụ onye ụkọ nri adịghị akọ.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 3:29
18 Iomraidhean Croise  

Devid we si ya, Ọbara-gi dikwasi n'isi-gi; n'ihi na ọnu-gi azawo megide gi, si, Mu onwem emewo ka ọ nwua, bú onye Jehova etere manu.


Jehova eweghachiwo n'isi-gi ọbara nile nke ulo Sọl, onye i buworo eze n'ọnọdu ya; Jehova enyewo kwa ala-eze n'aka Absalom, bú nwa-gi: ma, le, n'ihe ọjọ gi ka ejideworo gi, n'ihi na nwoke ọbara ka i bu.


Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:


Ma Neaman, bú onye-isi usu-ndi-agha eze Siria, bu nwoke di uku n'iru onye-nwe-ya, buru kwa onye anāhu iru-ọma, n'ihi na ọ bu n'aka-ya ka Jehova nyere Siria nzọputa: nwoke ahu bu kwa dike nke bu dìnkpà, ma ọ bu onye-ekpenta.


Ekpenta Neaman gārapara kwa n'aru gi, na n'aru nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi. Ọ we si n'iru ya pua, buru onye-ekpenta nēnwu dika snow.


M'gēkele Jehova dika ezi omume-Ya si di: M'gābùku kwa aha Jehova, bu Onye kachasi ihe nile elu, abù ọma.


ma ọ buru na o bilie, jeghari n'èzí, dabere na nkpa-n'aka-ya, agāgu onye tiri ya n'onye ikpé nāmagh: ọ bu nání na ọ gēnye ya ihe bayere nb͕uru-ya, me kwa ka aru-ya di ike nke-ọma.


Gwanu umu Israel okwu, si ha, Nwoke ọ bula, mb͕e orùrù di sitere n'anu-aru-ya, n'ihi orùrù-ya onye ruru árú ka ọ bu.


Unu emeru-kwa-la ala ahu nke unu onwe-unu bi nime ya: n'ihi na ọbara, nke ahu nēmeru ala: ma ala, agaghi-ekpuchiri ya nmehie-ya bayere ọbara awusiri nime ya, ma-ọbughi nání n'ọbara nke onye wusiri ya.


Mb͕e ndi ahu ndi nāsu asusu ọzọ huru anu-ọhia ahu ka o kokwasiri ya n'aka, ha we sirita ibe-ha, N'ezie nwoke a bu ob͕u-madu, onye ọ bu ezie na azọputara ya n'oké osimiri, ma Ikpé ziri ezi ekweghi ka ọ di ndu.


ndi-okenye nile nke obodo ahu, ndi nọkachasiri nso onye ahu eb͕uru eb͕u, gākwọ kwa aka-ha n'elu nwa-ab͕ọghọ-ehi ahu nke ab͕ajiri olu-ya nime ndagwurugwu ahu.


n'ihi na ha wusiri ọbara ndi nsọ na ndi-amuma, ọbara ka I nyewo-kwa-ra ha ka ha ṅua: ha bu ndi kwesiri ekwesi.


ka ihe-ike emere ọgu umu-ndikom Jerubeal atọ na iri we bia, ka ewe tukwasi kwa ọbara-ha n'isi Abimelek, bú nwa-nne-ha, onye b͕uru ha, na n'isi ndi-nwe Shekem, ndi mere ka aka-ya abua di ike ib͕u umu-nne-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan