Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 3:27 - Bible Nso

27 Abnea we laghachi rue Hebron, Joab we wezuga ya n'etiti ọnu-uzọ-ama ikpayere ya uka na nwayọ, o we tie ya n'okpuru ọgiriga-ya nke-ise n'ebe ahu, o we nwua n'ihi ọbara Asahel, bú nwa-nne-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

27 Mgbe Abna lọghachiri na Hebrọn, Joab duuru ya gaa nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama, dịka ọ chọrọ ka ha kparịtaa ụka. Ngwangwa, ọ mịpụtara nwa mma ya, jiri ya magbuo Abna, nʼihi ịbọ ọbọ ọbara nwanne ya, bụ Asahel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 3:27
16 Iomraidhean Croise  

Absalom we si, Ma ọ buru na i jeghi, biko, ka Amnon nwa-nnem soro ayi je. Eze we si ya, Nìhi gini ka ọ gēsoro gi je?


Amasa ka unu gāsi kwa, Ọ̀ bughi ọkpukpum na anu-arum ka i bu? Chineke mem otú a, mekwam ihe ọzọ otú a, ma ọ buru na i ghọghi onye-isi usu-ndi-agha n'irum ubọchi nile n'ọnọdu Joab.


Joab we si n'ebe Devid nọ puta, ziga ndi-ozi n'azu Abnea, ha we me ka o si n'olùlù-miri Saira biaghachi: ma Devid amaghi.


Devid we nu nke a mgbe emesiri, ọ si, Ndi puworo n'ọbara Abnea nwa Nea n'iru Jehova rue mb͕e ebighi-ebi ka mu na ala-ezem bu:


Ish-boshet nwa Sọl we nu na Abnea anwuwo nime Hebron, aka-ya we kuda, Israel nile ma-kwa-ra jijiji.


Jehova gēme kwa ka ọbara-ya laghachi n'isi-ya, n'ihi na ọ dakwasiri ndikom abua bu ndi ezi omume na ndi di nma kari ya, o were mma-agha b͕ue ha, ma nnam, bú Devid, amaghi ya, bú Abnea nwa Nea, onye-isi usu-ndi-agha Israel, na Amasa nwa Jeta, onye-isi usu-ndi-agha Juda.


Ọzọ kwa, gi onwe-gi amawo ihe Joab nwa Zeruaia merem, ihe o mere ndi-isi abua nke usu-ndi-agha nile nke Israel, bú Abnea nwa Nea na Amasa nwa Jeta, na o b͕uru ha, we wusi ọbara agha n'udo, tiye ọbara agha n'ihe-ọkiké-ya nke di n'úkwù-ya, na n'akpukpọ-ukwu-ya nke di n'ukwu-ya abua.


nke nkera ebo Manase di na Gilead, Ido nwa Zekaraia: nke Benjamin, Jaasiel nwa Abnea:


Ọ bu ezie na ikpọ-asi-ya ji nrafu ekpuchi onwe-ya, Ma agēkpughe ihe ọjọ ya nime nkpọkọta ndi-ya.


Ishmael nwa Netanaia we bilie, ya na ndikom iri ahu ndi ya na ha yikọrọ bia, ha we were mma-agha tib͕ue Gedalaia nwa Ahaikam, nwa Shefan, we me ka ọ nwua, bú onye eze Babilon mere onye-nlekọta ala ahu.


Onye-ọ́bọ̀ ọbara, ya onwe-ya gēme ka ob͕u-madu ahu nwua: mb͕e o zutere ya, ya onwe-ya gēme ka ọ nwua.


Ọ buru kwa na ọ kwatue ya n'ikpọ-asì, ma-ọbu tua ya ihe, mb͕e o nēche anwu, o we nwua;


Onye anābu ọnu ka ọ bu, bú onye nētib͕u madu-ibe-ya na nzuzo. Ndi Israel nile gāsi kwa, Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan