Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 3:16 - Bible Nso

16 Di-ya we soro ya je, nēje nākwa ákwá n'azu ya rue Bahurim. Abnea we si ya, Je, laghachi: o we laghachi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

16 Mgbe ha du ya na-aga, Paltiel sogidere ya nʼazụ na-akwa akwa tutu ha eruo Bahurim. Nʼebe ahụ ka Abna nọ sị ya, “Laghachi ugbu a.” Ọ tụgharịrị laa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 3:16
9 Iomraidhean Croise  

Eze, bú Devid, we biarute Bahurim, ma, le, otú nwoke nke sitere n'ab͕uru ulo Sọl nēsi n'ebe ahu puta, aha-ya bu Shimai, nwa Gira: ọ nāputa, nākọcha ka ọ nāputa.


Otù nwa-okoro we hu ha, gosi, Absalom: ha abua we je ngwa ngwa, ba n'ulo otù nwoke nime Bahurim, onye nwere olùlù-miri n'ogige-ya; ha we rida n'ebe ahu.


Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke sitere na Bahurim, we me ngwa soro ndikom Juda ridata izute eze, bú Devid.


Nnù ndikom abua na ọgu iri so-kwa-ra ya site na Benjamin; Ziba kwa, onye nējere ulo Sọl ozi, ya na umu-ya ndikom iri na ise na orú ndi-orú-ya; ha we jisie ike gabiga Jọdan n'iru eze.


Abi-albon onye Araba, Azmavet onye Bahurim;


Ish-boshet we ziga, nara ya n'aka di-ya, bú n'aka Paltiel nwa Laish.


Ma, le, ọ di n'aka-gi, bú Shimai nwa Gira, bú onye Benjamin, nke Bahurim, onye ya onwe-ya kọcharam nkọcha jọb͕uru onwe-ya n'ubọchi m'jere Mahanaim: ma ya onwe-ya ridara izutem na Jọdan, m'we were Jehova ṅuara ya iyi, si, M'gaghi-ewere mma-agha me ka i nwua ma-ọli.


Ishmael nwa Netanaia we si na Mizpa pua izute ha, nēje ije nākwa ákwá: o rue, mb͕e o zutere ha, na ọ siri ha Biakutenu Gedalaia nwa Ahaikam.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan