Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 24:12 - Bible Nso

12 Je gwa Devid okwu, si, Otú a ka Jehova siri, Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe-gi otù nime ha, ka M'we me gi ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Gaa gwa Devid, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: Ụzọ ihe atọ ka m na-eche gị nʼihu. Họrọ otu nʼime ha nke m ga-eme ka ọ bịakwasị gị.’ ”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 24:12
13 Iomraidhean Croise  

Otú ọ di, n'ihi na i mewo ka ndi-iro Jehova kpọlu nkpọlu nke-uku n'okwu a, nwa-nwoke nke amuru gi aghaghi inwu kwa.


Devid we bilie n'ututu, okwu Jehova we rue Gad nti, bú onye-amuma, onye-ọhu-uzọ nke Devid, si,


Gad we biakute Devid, si, ya, Ọ̀ bu oké unwu arọ asa gābiakute gi n'ala-gi? mà-ọbu na i ganāb͕alaga n'iru ndi nākpab͕u gi ọnwa atọ, mb͕e ndi ahu nāchu gi: mà-ọbu na ajọ ọria nēfe efe gādi n'ala-gi ubọchi atọ? ub͕u a mata, le kwa okwu m'gēweghachiri Onye nēzitem.


Joab nwa Zeruaia malitere iguta ha, ma ọ guzughi; iwe we dikwasi Israel n'ihi nka; etiyeghi kwa ọnu-ọgugu n'ọnu-ọgugu nke di n'akwukwọ ihe emere n'ubọchi nke eze, bú Devid.


N'ihi na onye Jehova nāhu n'anya ka Ọ nābara nba; Ọbuná dika nna si abara nwa-ya nke ihe-ya nātọ ya utọ nba.


N'ihi na gi ka M'nọyere, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), izọputa gi: n'ihi na M'gēme ka mba nile gwusia, bú ebe M'chusaworo gi, ma otú ọ di, gi ka M'nāgaghi-eme ka i gwusia: ma M'gādọ gi aka na nti n'ikpé, M'gaghi-asi kwa na i bu onye ikpe nāmaghi ma-ọli.


Mu onwem we nējeghari kwa n'imegide ha, me ka ha ba n'ala ndi iro ha: ma ọ buru na obi-ha nke anēbighi úgwù eruru ala mb͕e ahu, ọ buru kwa na ahuhu ajọ omume-ha atọ ha utọ mb͕e ahu;


Ha gārapu kwa ala ahu, ubọchi-izu-ike-ya nile gātọ kwa ya utọ, n'itọb͕ọ-n'efu ahu mb͕e ha nānọghi ya; ahuhu ajọ omume-ha gātọ kwa ha onwe-ha utọ: n'ihi na, ọbuná n'ihi na ikpém nile ka ha juru, ọ bu kwa ukpurum nile ka nkpuru-obi-ha sọrọ oyi.


Ka ha ra, bú ndi Mu onwem huru n'anya, anamatu ha nmehie ha n'anya, zí kwa ha ihe site n'inye ha ahuhu: ya mere, nānu ọku n'obi, chèghari kwa.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan