Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 23:9 - Bible Nso

9 Nke so ya bu Eleeza nwa Dodai nwa onye Ahoa, bú otù onye n'etiti ndi-dike atọ ahu ndi ha na Devid nọ mb͕e ha rara onwe-ha nye rue ọnwu n'etiti ndi Filistia ndi chikọtara onwe-ha n'ebe ahu ibu agha, ma ndikom Israel rigoro:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Onye nke na-eso ya bụ Elieza, nwa Dodayi, onye Ahohi. Dịka otu nʼime ndị dike atọ ahụ, ya na Devid nọ mgbe ha na-akwa ndị Filistia emo, bụ ndị zukọrọ na Pas Damim ibu agha. Mgbe ahụ, ndị Izrel lara azụ,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 23:9
12 Iomraidhean Croise  

Ma onye-isi òkè nke ọnwa nke-abua bu Dodai onye Ahoa, na òkè-ya; Miklot bu kwa onye-ndú-ha: orú nnù ndikom uzọ atọ di kwa n'òkè-ya.


na Abishua, na Neaman, na Ahoa;


Ọ buru kwa na madu enwe ike n'aru otù onye nání ya di, ma otú ọ di, madu abua gēguzo imegide ya; ọzọ, udọ̀ atọ nke atukọtara n'otù, adighi-adọbì ya ngwa ngwa.


Ebe-nzọcha-nkpuru-vine ka M'zọchara, náním; ma nime ndi nile di iche iche ọ dighi onye ọ bula Mu na ya nọ: M'we zọcha ha n'iwem, zọda ha n'ọnumam; ọbara-ndu-ha we fesa n'uwem nile, ọ bu kwa uwe-oyiyim nile ka M'meruru emeru.


M'we legide anya, ma ọ dighi onye nēne aka; ibobo we nwuam n'aru na ọ̀ dighi onye nākwagide: ogwe-akam we wetaram nzọputa; ọnumam kwa, ya kwagiderem.


Ha nile we rapu Ya, b͕alaga.


Onye Filistia ahu we si, Mu onwem atawo usoro-agha nile nke Israel uta ta; nyenum otù nwoke, ka ayi we lurita ọ̀gù.


Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta?


Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan