ha we biakute Gedalaia rue Mizpa, bú Ishmael nwa Netanaia, na Johanan na Jonatan, bú umu Karea, na Seraia nwa Tanhumet, na umu Efai, bú onye Netofa, Jezanaia nwa onye Meaka, ha onwe-ha na ndikom-ha.
na Zela, na Elef, na ndi Jebus (nke ahu bu Jerusalem), na Gibeat, na Kiriat; obodo iri na anọ na obodo ntà ha. Nka bu ihe-nketa umu Benjamin dika ab͕uru nile ha si di.
Sọl we rọputara onwe-ya nnù ndikom asa na ọgu iri sitere n'Israel; nnù ndikom ise we di n'aka Sọl nime Mikmash na n'ugwu Bet-el, nnù ndikom abua na ọgu iri di kwa n'aka Jonatan nime Gibea Benjamin: ma o zilagara ndi fọduru n'etiti ndi Israel, onye ọ bula n'ulo-ikwū-ya.