Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:48 - Bible Nso

48 Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, Onye nēme kwa ka ndi di iche iche rida n'okpurum,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

48 Ọ bụ Chineke ahụ, onye na-abọrọ m ọbọ. Onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:48
11 Iomraidhean Croise  

Ahimaaz nwa Zedok we si, Biko, ka m'b͕a ọsọ zìe eze ozi ọma, na Jehova ekpeputawo ya n'aka ndi-iro-ya.


Ma, le, onye Kush biara; onye Kush we si, Ka ezìe onye-nwem, bú eze, ozi ọma: n'ihi na Jehova ekpeputawo gi ta n'aka ndi nile nēbili imegide gi.


Ha we butere Devid isi Ish-boshet rue Hebron, si eze, Le, isi Ish-boshet nwa Sọl, bú onye-iro-gi, nke chọrọ ndu-gi; ma Jehova abọworo onye-nwem, bú eze, ọ́bọ̀ ta n'aru Sọl, na n'aru nkpuru ya.


Ihe nke si n'ọnu Jehova puta nāsi onye-nwem, Nọdu ala n'aka-nrim, Rue mb͕e M'gēdo ndi-iro-gi ka ihe-nb͕akwasi diri ukwu-gi abua.


Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum.


Chineke nke ọ́bọ̀ nile, Jehova, Chineke nke ọ́bọ̀ nile, nwuputa ìhè.


N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya.


Mu nwe ọ́bọ̀ na nkwughachi, Na mb͕e ukwu-ha gāb͕uchapu: N'ihi na ubọchi nhuju-anya-ha di nso, Ihe nke ejikereworo ha nābia kwa ngwa ngwa.


Jehova kpe ikpe n'etiti mu na gi, Jehova bọ-kwa-ram ọ́bọ̀ n'aru gi: ma akam agaghi-adi n'aru gi.


O gēru kwa, mb͕e Jehova gēmewori nye onye-nwem dika ezi ihe nile si di nke O kwuworo bayere gi, mb͕e Ọ gēnyewo kwa gi-ri iwu ibu onye-ndú Israel;


Devid we nu na Nebal anwuruwo, ọ si, Onye agọziri agọzi ka Jehova bu, Onye kpere ọnu ihe-ita-utam n'ikpé, me ka m'pua n'aka Nebal, O we b͕ochie orù-Ya ka ọ ghara ime ihe ọjọ: ma ihe ọjọ Nebal ka Jehova meworo ka ọ lata n'isi-ya. Devid we ziga kwue okwu bayere Abigail, iluta ya n'onwe-ya na nwunye.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan