41 Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha, Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha.
41 I meela ka ndị iro m tụgharịa gbalaga. Ebibiekwala m ha niile.
Juda, gi onwe-gi, umu-nne-gi gēkele gi: Aka-gi di n'olu ndi-iro-gi; Umu-ndikom nna-gi gākpọ isi ala nye gi.
Oké ujọm ka M'gēziga n'iru gi, chusa ha, bú ndi ahu nile i gābakute ha, M'gēnye kwa gi olu ndi-iro-gi nile.
Ma ndi-obodo-ya kpọrọ ya asì, ha we zìe ndi-ozi ga n'azu ya, si, Ayi achọghi ka nwoke a buru eze-ayi.
Otú ọ di, ndi-irom ndia, ndi nāchọghi ka m'buru eze-ha, kuta ha n'ebe a, b͕ue ha n'irum.
O rue, mb͕e ha mere ka eze ise ahu pukute Joshua, na Joshua kpọrọ ndikom nile nke Israel, si ndi-ọchi-agha nke ndikom agha ndi soro ya je, Bianu nso, zọkwasinu ukwu-unu n'olu eze ndia. Ha we bia nso, zọkwasi ukwu-ha n'olu-ha.