37 I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
37 Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ. Ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.
O we me ka m'puta rue ebe sara mbara: Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ.
Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura.
Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.
I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa.
Mb͕e m'kpọrọ, Gi zam, Chineke nke ezi omumem; I nyewom ebe sara mbara mb͕e m'nọ na nkpà: Merem amara, nuru ekperem.
Ọ buru na asiwom, Ewezugawo ukwum n'ọnọdu-ya; Ebere-Gi nākwagidem, Jehova.
Mb͕e i nēje ije, agaghi-akpagide nzọ-ukwu-gi; Ọ buru kwa na i b͕a ọsọ, i gaghi-asu ngọngọ.
Ukwu ndi-ebere-Ya ka Ọ nēdebe, Ma agēme ka ndi nēmebi iwu-Ya debe ọnu-ha dū n'ọchichiri; N'ihi na ọ bughi ike ka madu gēji kari n'ike.