Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:33 - Bible Nso

33 Chineke bu ebem siri ike nke di ike nke-uku: Ọ nākwazu kwa uzọm.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:33
19 Iomraidhean Croise  

ọ we si, Jehova bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka m'b͕apu, Onye m'nwere;


Ọ̀ nātọ Onye puru ime ihe nile utọ na i bu onye ezi omume? Ma-ọbu ọ̀ bu urù n'ebe Ọ nọ na i nēme ka uzọ-gi nile zue okè?


M'gēnwe uche n'uzọ zuru okè: Òle mb͕e I gābiakutem? M'gējeghari n'etiti ulom n'izu-okè nke obim.


Anyam abua di n'aru ndi kwesiri ntukwasi-obi n'ala, ka mu na ha we biri: Onye nēje ije n'uzọ zuru okè, onye ahu gējerem ozi.


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.


Jehova bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m'gātu egwu? Jehova bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m'gātu oké egwu?


M'gēme ka i nwe uche, M'gēzi kwa gi ihe n'uzọ nke i gēje ije nime ya: M'gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n'aru.


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa: Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu; Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.


atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.


M'gēme kwa ka ha di ike nime Jehova; ọ bu kwa n'aha-Ya ka ha ganējeghari; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem.


Nke fọduru, menu onwe-unu ka unu di ike nime Onye-nwe-ayi, ya na nime idi-ike nke ike-Ya.


Onye zuru okè ka i gābu n'ebe Jehova, bú Chineke-gi, nọ.


Enwerem ike n'ihe nile nime Onye ahu Nke nēmem ka m'di ike.


Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan