Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:3 - Bible Nso

3 Ọ bu Chineke nke oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum, na ebe-nb͕alagam; Onye-nzọputam, I nāzọputam n'ihe-ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Chineke m bụ oke nkume m, onye m gbabara nʼime ya. Ọ bụ ọta m, na mpi nzọpụta m. Ya bụ oke nkume m nke onye ọbụla na-apụghị ịba nʼime ya, ebe mgbaba m, na onye nzọpụta m, site nʼaka ndị na-eme ihe ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:3
52 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ihe ndia gasiri, okwu Jehova ruru Abram nti n'ọhù, si, Atula egwu, Abram: Mu onwem bu ọta diri gi, ugwọ-ọlu-gi riri nne nke-uku.


Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya.


Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke oké nkume nzọputam di kwa elu:


Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.


Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku: Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere rue mb͕e ebighi-ebi.


Chineke Israel siri, Mu ka Oké Nkume Israel gwara okwu: Onye nāchi madu bu onye ezi omume, Ọ nāchi n'egwu Chineke


Unu nēme ndum-ọdu nke onye ewedara n'ala ka ọ buru ihe-ihere, N'ihi na Jehova bu ebe-nb͕abà-ya.


Jehova, dọputam n'aka madu ọjọ; Chebem ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike di iche iche:


Madu nke nwere ire ọjọ agaghi-eguzosi ike n'uwa: Madu nke nēme ihe-ike, ihe ọjọ ga-chunta ya inudasi ya.


Debem, Jehova, ka m'ghara ida n'aka onye nēmebi iwu; Chebem, ka m'ghara ida n'aka nwoke nēme ihe-ike: Bú ndi chèworo inuda nzọ-ukwum nile.


Legide n'aka-nrim, hu kwa, n'ihi na ọ dighi onye m'nwere nke nāmatam: Ebe-nb͕alaga alanariwom n'iyì; ọ dighi onye nāju ajuju bayere nkpuru-obim.


Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum.


Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum.


N'ihi na Ọ gēdebem na nzuzo n'ulo-ntu-Ya n'ubọchi ihe ọjọ: Ọ gēzobem n'ebe-nzuzo nke ulo-ikwū-Ya; N'oké nkume ka Ọ gēbulim elu.


Jehova bu ikem na ọtam; Ya ka obim tukwasiworo obi, eyewo-kwa-ram aka: Obim we nāwuli elu n'ọṅù; M'gēsite kwa n'abùm kele Ya.


Ma Gi onwe-gi, Jehova, bu ọta buruburum, Na nsọpurum, na onye nēbuli isim elu.


Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m'pua n'ahuhu; Iti-nkpu nke mb͕e anēme ka ab͕apu, ndia ka I gēme ka ha dim buruburu. Selah


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


N'ihi nka ayi agaghi-atu egwu mb͕e uwa nāb͕anwe, Ma-ọbu mb͕e anēwezuga ugwu nile n'ọnọdu-ha ga n'etiti oké osimiri;


Jehova nke usu nile nke ndi-agha nọyere ayi; Chineke nke Jekob buru ayi ulo-elu. Selah


N'ihi na Gi onwe-gi nāgọzi onye ezi omume; Jehova, I ji otú ihe-ya si atọ Gi utọ b͕a ya buruburu dika ọta uku.


Onye-nwe-ayi, loda ha, kesa ire-ha: N'ihi na ahuwom ihe-ike na ilu-ọ̀gù n'obodo.


Ma mu onwem gābù abù bayere ike-Gi; E, m'gēti nkpu ọṅù bayere ebere-Gi n'ututu: N'ihi na I buruworom ulo-elu, Na ebe-nb͕alaga n'ubọchi nkpab͕u dirim.


N'ihi na I buworom ebe-nb͕abà, Ulo-elu di ike ipu n'iru onye-iro.


Aghọworom ọtutu madu ihe-ebube; Ma Gi onwe-gi bu ebe-nb͕abàm di ike.


Ọ gēsi n'aka nzọb͕u na n'aka ime-ihe-ike b͕aputa nkpuru-obi-ha; Ọbara-ha gādi kwa oké ọnu-ahia n'anya-ya.


N'ihi na anyanwu na ọta ka Jehova, bú Chineke, bu: Amara na nsọpuru ka Jehova gēnye: Ọ gaghi-eb͕ochi ezi ihe n'ebe ndi nējeghari n'izu-okè nọ.


Le ọta-ayi, Chineke, Legide kwa iru onye-Gi etere manu.


Chineke, ndi-nganga ebiliwo imegidem, Nzukọ ndi nēme ka madu ma jijiji achọwo kwa nkpuru-obim, Ha edoghi kwa Gi n'iru ha.


Ọzọ, ndi mara aha-Gi gātukwasi Gi obi; N'ihi na I rapughi ndi nāchọ Gi, Jehova.


Jehova bu-kwa-ra onye anāzọpia ulo-elu, Bú ulo-elu nke diri mb͕e nile nke nkpà;


Ikem na abù ọmam ka Ja bu, Ọ we ghọrọm nzọputa: Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu; Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.


Ulo-elu di ike ka aha Jehova bu: Nime ya ka onye ezi omume nāb͕abà, o we nọ n'elu.


Okwu-ọnu ọ bula nke Chineke bu ihe anuchaworo: Ọta ka Ọ buru ndi nāb͕abà nime Ya.


Le, Chineke bu nzọputam; m'gātukwasi Ya obi, ghara itu egwu: n'ihi na ikem na abù ọmam ka Ja JEHOVA bu; O we ghọrọm nzọputa.


Otù onye gādi kwa ka ebe izonari ifufe, na ebe-nzuzo ipu n'oké miri-ozuzo; dika ọtutu iyi juputara na miri n'ebe kpọrọ nku, dika ǹdò nke oké nkume di elu n'ala nke kpatara ike-ọgwugwu.


Gosinu, weta-kwa-nu ha nso; e, ka ha b͕akọ ìzù n'otù: ònye mere ka anu ihe a site na mb͕e gara aga? onye sitere na mb͕e ochie gosi ya? ọ̀ bughi Mu onwem, bú Jehova? ọ dighi kwa Chineke ọzọ di ma ewezuga nání Mu onwem; Chineke Nke nēme ezi omume na onye-nzọputa adighi ma ewezuga nání Mu onwem.


Jehova, ikem, na ebem siri ike, na ebe-nb͕abàm n'ubọchi nkapab͕u, Gi ka mba nile gābiakute site na nsọtu nile nke uwa, si, Nání okwu-agha ka nna-ayi-hà ketaworo, bú ihe-efu na ihe nke ọ nadighi urù ha bara.


N'ihi na otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje ime ka olu nke obi-utọ na olu ọṅù na olu nwoke nālu nwunye ọhu na olu nwanyi anālu ọhu kwusi n'ebe a n'anya-unu na n'ubọchi-unu.


Ọ nātọ kwa mọm utò nke-uku na Chineke, bú Onye-nzọputam.


O weliwo-kwa-ra ayi mpi nke nzọputa N'ulo onye nējere Ya ozi, bú Devid


Nzọputa n'aka ndi-iro-ayi, na n'aka ndi nile nākpọ ayi asì;


Ọ gāsi kwa, Òle ebe chi nile ha nọ? Bú oké nkume nke ha b͕abàra nime ya;


Oké nkume ahu, ihe zuru okè ka ọlu-Ya bu: N'ihi na uzọ-Ya nile bu ikpé ziri ezi: Chineke Nke kwesiri ntukwasi-obi, Nke nēnweghi ajọ omume, Onye ezi omume na onye ziri ezi ka Ọ bu.


Onye ihe nile nāgara nke-ọma ka i bu, Israel: Ònye di ka gi? bú ndi Jehova zọputaworo, Onye bu ọta nke iye-aka-gi, Onye bu kwa mma-agha nke nbili-elu-gi! Ndi-iro-gi gērube kwa isi aghughọ n'okpuru gi; Gi onwe-gi gāzọkwasi kwa ebe di elu nke ha ukwu.


Ma mb͕e egosiri obi-ọma nke Onye-nzọputa-ayi Chineke, ya na ihu-n'anya-Ya n'ebe madu nọ,


Onye Ọ wusara ayi nime àkù-Ya nile, site n'aka Jisus Kraist Onye-nzọputa-ayi;


Ọzọ kwa, Mu onwem ganātukwasi obim na Ya. Ọzọ kwa, Le, Mu onwem na umu-ntakiri Chineke nyerem.


Hana we kpe ekpere, si: Ọ nātọ obi m utọ n'ime Jehova, Mpim adiwo elu n'ime Jehova: Ọnum asawo mbara n'elu ndi-irom, N'ihi na aṅuriwom ọṅu na nzọputa-Gi.


Ọ dighi onye di nsọ dika Jehova; N'ihi na ọ dighi onye ọzọ ma-ọbughi Gi: Ọ dighi kwa oké nkume ọ bula dika Chineke-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan