Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:28 - Bible Nso

28 I gāzọputa kwa ndi ewedara n'ala: Ma anya-Gi abua dikwasi ndi di elu, ka I we me ka ha di ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

28 Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma anya gị dị nʼahụ ndị mpako, I mee ka ha dị ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:28
23 Iomraidhean Croise  

N'ihi ipunara ndi ewedara n'ala ihe, n'ihi isu-ude nke ndi-ob͕eye, Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova kwuru; M'gēdo ya na nzọputa nke o nēkusi ume ike inwe.


Jehova, nkpuru-obim adighi elu, anyam abua ebulighi kwa onwe-ha elu; Ejegharighkwam n'ihe uku di iche iche, Ma-ọbu n'oké ọlu di iche iche karirim.


N'ihi na Jehova di elu, ma ọ bu onye di ume-ala n'obi ka Ọ nāhu anya: Ma onye-npako, Ọ nēsite n'ebe di anya mara ya.


Amawom na Jehova gēmezi okwu-ikpe onye ewedara n'ala, Na ikpé ziri ezi nke ndi-ob͕eye.


Moses na Eron we bakuru Fero, si ya, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke ndi-Hibru, siri, Rùe ole mb͕e i gāju iweda onwe-gi n'ala n'irum? zipu ndim, ka ha we fèm.


Ub͕u ka m'mara na Jehova di uku kari chi nile: e, n'ihe nke ha di nganga megide ha.


Anya npako na obi di nganga, Ọbuná oriọna nke ndi nēmebi iwu, bu nmehie.


Aghaghi kwa iruda npako madu, aghaghi kwa ime nbuli-elu nke ndi nile ka ọ di ala: aghaghi kwa ime ka Jehova, nání Ya, di elu n'ubọchi ahu.


Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.


Onye di ala we ruda n'ala, onye di elu nēme kwa onwe-ya ka ọ di ala, anēme kwa anya abua nke ndi di elu ka ha di ala:


Na nkpab͕u nile ha Ya ka anākpab͕u, ọ bu kwa mọ-ozi nke iru-Ya zọputara ha: n'ihu-n'anya-Ya na n'ọmiko-Ya Ya onwe-ya b͕aputara ha; O we palie ha, kuru ha ubọchi nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga.


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


Ngọzi nādiri ndi bu ob͕eye nime mọ-ha: n'ihi na ala-eze nke elu-igwe bu nke ndi ahu.


N'ihi na onye ọ bula nke nēweli onwe-ya elu, agēweda ya; ọzọ, onye nēweda onwe-ya, agēweli ya elu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan