ka obi-ya we ghara idi elu kari umu-nne-ya, ka ọ ghara kwa isi n'ihe enyere n'iwu wezuga onwe-ya, n'aka-nri, ma-ọbu n'aka-ekpe: ka o we me ka ubọchi-ya di anya n'ala-eze-ya, ya onwe-ya na umu-ya, n'etiti Israel.
Ọ gēru kwa, n'ihi na unu nānu ikpé ndia, debe kwa ha, me kwa ha, na Jehova, bú Chineke-gi, gēdebe-kwa-ra gi ọb͕ub͕a-ndu ahu na ebere ahu nke Ọ ṅuru nna-gi-hà iyi imere ha:
Lezie onwe-gi anya ka i ghara ichezọ Jehova, bú Chineke-gi, n'edebeghi ihe nile O nyere n'iwu, na ikpé-Ya nile, na ukpuru-Ya nile, nke mu onwem nēnye gi n'iwu ta: