Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:22 - Bible Nso

22 N'ihi na edebewo uzọ nile nke Jehova, Emebighkwam iwu n'ipu n'aka Chinekem.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke Onyenwe anyị; ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:22
15 Iomraidhean Croise  

N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.


Ma gi onwe-gi, ọ buru na i jegharia n'irum, dika Devid, bú nna-gi, jeghariri, n'izu-okè nke obi, na n'izi-ezi, ime dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu, ọ buru na i debe ukpurum nile na ikpém nile;


Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi zuru okè n'uzọ Jehova bu, Ndi nējeghari n'iwu jehova.


Ma ndi nēwezuga onwe-ha ije n'uzọ nile ha b͕agọro ab͕agọ, Jehova gēme ka ha na ndi nālu ajọ ihe yikọ la. Ka udo dikwasi Israel.


Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ọ bula nke nātu egwu Jehova bu, Nke nēje ije n'uzọ-Ya nile.


Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem.


Okwu nile nke ọnu-ya bu ajọ ihe na aghughọ: Ọ rapuwo inwe uche na ime nma.


Ma ub͕u a, umum, genum nti: N'ihi na ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe uzọm nile bu.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Moses we we iwe di ọku nke-uku, ọ we si Jehova, Echela onyinye-inata-iru-ọma-ha iru: ọ dighi otù inyinya-ibu m'naraworo n'aka-ha, ọ dighi kwa otù onye nime ha M'mejọworo.


Ọ buru na unu edebe ihe nile M'nyere n'iwu, unu gānọgide n'ihu-n'anyam; dika Mu onwem debeworo ihe nile Nnam nyere n'iwu, nọgide kwa n'ihu-n'anya-Ya.


N'ihi na inya-isi-ayi bu nka, àmà nke akọ-na-uche-ayi, na ọ bu n'idi-nsọ na idi-ọcha nke Chineke, ọ bughi n'amam-ihe nke anu-aru, kama ọ bu n'amara Chineke, ka ayi biri obi n'uwa, ma ọ bu n'ebe unu nọ ka ayi bikariri obi-ayi nke-uku.


Lem: b͕agidem àmà n'iru Jehova, na n'iru onye nke Ya etere manu: ọ̀ bu ehi onye ka m'naraworo? ma-ọbu ìnyinya-ibu onye ka m'naraworo? ma-ọbu ònye ka m'meb͕uworo? ònye ka m'zọpiaworo? ma-ọbu n'àka onye ka m'naraworo ihe-nb͕aputa iji zopu anyam n'aru ya? m'gēnyeghachi kwa unu ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan