Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:21 - Bible Nso

21 Jehova nēnyeghachim dika ezi ọmumem si di: Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka Ọ nēmeghachim ọzọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

21 “Onyenwe anyị mesoro m dịka ezi omume m si dị, Ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:21
13 Iomraidhean Croise  

Jehova we meghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcham n'anya-Ya si di.


Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.


Gi onwe-gi nuru kwa n'elu-igwe, me kwa, kpe ndi-orù-Gi ikpe, igu onye nēmebi iwu n'onye nēmebi iwu, itukwasi uzọ-ya n'isi-ya; na igu onye ezi omume n'onye ezi omume, inye ya dika ezi omume-ya si di.


Ma onye ezi omume gējisi ike n'iso uzọ-ya, Onye nke aka-ya abua di ọcha ganāga n'iru n'iru n'inwe ume.


Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa.


Onye nwere ọbu-aka abua nēmeghi ihe ọjọ, na obi di ọcha; Onye nēbulighi nkpuru-obi-ya nye ihe-efu, Ọ ṅughi kwa iyi aghughọ.


Jehova nēkpe ndi nile di iche iche ikpe: Kpem ikpe, Jehova, dika ezi omumem si di, na dika izu-okèm si di nke di nimem.


Le, agākwughachi onye ezi omume ugwọ n'uwa: Àgēsi kwa aṅa ghara ikwughachi onye nēmebi iwu na onye-nmehie?


Ya mere, umu-nnam m'huru n'anya, guzosienu ike, burunu ndi anāpughi iropu eropu, ndi nālubiga ọlu Onye-nwe-ayi ókè mb͕e nile, ebe unu matara na ndọb͕u unu nādọb͕u onwe-unu n'ọlu abughi ihe-efu nime Onye-nwe-ayi.


Biarunu Chineke nso, Ọ gābiaru kwa unu nso. Menu ka aka-unu di ọcha, unu ndi-nmehie; me-kwa-nu ka obi-unu di ọcha, unu ndi nwere uche abua.


Jehova gēnyeghachi kwa nwoke ọ bula ezi omume-ya na ikwesi-ntukwasi-obi-ya: ebe Jehova nyeworo gi n'akam ta, ma ekweghm iseti akam imegide onye Jehova etere manu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan