Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M'gaghi-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n'ihi na Gi onwe-gi nọyerem: Ndele-Gi na nkpa-n'aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.
Ndi-Gi ndi nwuru anwu gādi ndu; ozum nile gēbili. Tetanu, tie nkpu ọṅù, unu ndi bi n'ájá: n'ihi na igirigi nke ìhè nile ka igirigi-Gi bu, ala gāmuputa kwa ndi nādighi ndu.
atula egwu, gi ka M'nọyere: elela anya buruburu n'ujọ, n'ihi na Mu onwem bu Chineke-gi: M'gāb͕a gi ume; e, M'gēyere gi aka; e, M'gēji aka-nri nke ezi omumem kwagide gi.
Onye n'etiti unu bu onye nātu egwu Jehova, nēge nti n'olu orù-Ya? onye nke jeworo ije n'ọchichiri, nke ọ dighi onwunwu-ọku o nwere, ya tukwasi obi n'aha Jehova, dabere Chineke-ya.