17 O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri;
17 “O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile.
Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, N'aka ndi nākpọm asì; n'ihi na ha nwere ume karim
N'ob͕u-miri nile ka m'siworo kpọkue Gi, Jehova.
Si n'elu setipu aka-Gi; Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri, N'aka ndi ala ọzọ;
O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri.
N'ihi nka ka onye-ebere ọ bula kpere Gi na mb͕e agēji chọta Gi: N'ezie n'iju-miri nke ọtutu miri ha agaghi-eru ya aru.
Nwa ahu we tó etó, nne-ya we me ka ọ biakute nwa-nwayi Fero, ọ we ghọrọ ya nwa nke ya. Ọ kpọ aha-ya Moses, si, N'ihi na nime miri ka m'dọputara ya.
Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.
Miri rubigaram n'isi; asirim, Ebipuwom.
O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.