Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 22:1 - Bible Nso

1 Devid we gwa Jehova okwu nile nke abù a n'ubọchi Jehova naputara ya n'ọbu-aka ndi-iro-ya nile na n'ọbu-aka Sọl:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

1 Devid buuru Onyenwe anyị okwu niile nke abụ a mgbe Onyenwe anyị napụtara ya site nʼaka ndị iro ya niile, nakwa nʼaka Sọl.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 22:1
20 Iomraidhean Croise  

Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n'aka Sọl;


Onye nēme kwa ka m'si n'aka ndi-irom pua: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe ike.


Mb͕e ahu, n'ubọchi ahu, Devid buru uzọ nye iwu ikele Jehova, site n'aka Esaf na umu-nne-ya.


Ha di ọtutu, bú ihe ọjọ nke nādakwasi onye ezi omume: Ma n'aka ha nile ka Jehova nānaputa ya.


Chuara Chineke ekele dika àjà; Kwughachi kwa Onye kachasi ihe nile elu nkwa nile i kwere:


Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si, Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku: Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.


Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;


Moses we kwue na nti nkpọkọta nile nke Israel okwu nile nke abù a, rue mb͕e ekwuzuru ha.


Onye-nwe-ayi gādọputam n'ajọ ọlu nile ọ bula, Ọ gāzọputakwam ka m'bata n'ala-eze-Ya di n'elu-igwe: Onye otuto diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen.


Debora na Berak nwa Abinoam we bùa abù n'ubọchi ahu, si,


Devid we nọdu n'ọzara n'ebe ewusiri ike, o we nọdu n'ugwu n'ọzara Zif. Sọl we nāchọ ya ubọchi nile, ma Chineke enyeghi ya n'aka-ya.


Ma Jehova buru onye-ikpe, kpe ikpe n'etiti mu na gi, Ya hu kwa, kpe ọnum n'ikpe, kpeputam n'aka-gi.


Ọ bu kwa ezie na madu biliri ichu gi, na ichọ nkpuru-obi-gi: ma agēke nkpuru-obi onye-nwem na ngugu nke ndi di ndu n'aka Jehova, bú Chineke-gi; ma nkpuru-obi ndi-iro-gi, ha ka Ọ gēsi n'etiti oghere èbè-Ya mapu.


Ma, le, dika ndu-gi di uku ta n'anyam, ka ndum di uku otú a n'anya Jehova, ka Ọ naputakwam na nkpab͕u nile.


Devid we si obi-ya. Ub͕u a agēkpochapum otù ubọchi site n'aka Sọl: ọ dighi ihe dirim nma kari iwepugasi onwem ba n'ala ndi Filistia; Sọl agaghi-atukwasi kwa obi-ya n'arum, ichọm ọzọ n'ókè-ala nile nke Israel: m'gēwepuga kwa onwem n'aka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan