Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 21:3 - Bible Nso

3 Devid we si ndi Gibeon, Gini ka m'gēmere unu? gini kwa ka m'gēji kpuchie nmehie, ka unu we gọzie ihe-nketa Jehova?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

3 Devid jụrụ ndị Gibiọn ajụjụ sị, “Gịnị ka m ga-emere unu? Gịnị ka m ga-eji kpuchie mmehie a e mere megide unu, ime ka unu gọzie ihe nketa Onyenwe anyị?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 21:3
9 Iomraidhean Croise  

Mu onwem bu otù onye nime ndi-udo ndi kwesiri ntukwasi-obi n'Israel: gi onwe-gi nāchọ ime ka otù obodo na otù nne n'Israel nwua: n'ìhi gini ka i gēloda ihe-nketa Jehova?


O rue, n'echi-ya, na Moses siri ndi Israel, Unu onwe-unu emehiewo nmehie uku: ma ub͕u a m'gārigokuru Jehova; eleghi anya m'gēkpuchi nmehie-unu.


O gēbikwasi aka-ya n'isi àjà-nsure-ọku ahu; agānara kwa ya nke-ọma n'ọnọdu ya iji kpuchiri ya nmehie-ya.


Ha we si ya, Gini ka ayi gēme gi, ka oké osimiri we dajua ghara imakwasi ayi? n'ihi na oké osimiri nọ nāmali onwe-ya elu.


Ọ fọduru ihe ntà ka m'si na eji kwa ọbara eme ihe nile ka ha di ọcha, dika iwu-ayi si di, ọ buru kwa na nwusì ọbara adighi nb͕aghara nmehie adighi.


Ọ buru na madu emehie megide madu, Chineke gēkpe kwa ya ikpe: ma ọ buru na ọ bu Jehova ka madu nēmehie megide, ònye gēkpere Jehova ekpere bayere ya? Ma ha egeghi nti olu nna-ha, n'ihi na ọ tọrọ Jehova utọ ime ka ha nwua


Ma ub͕u a, biko, ka onye-nwem, bú eze, nuru okwu nile nke orù-ya. Ọ buru na Jehova arafuwo gi imegidem, Ya nu ísì utọ nke onyinye-inata-iru-ọma: ma ọ buru umu madu, ndi anābu ọnu ka ha bu n'iru Jehova; n'ihi na ha achupuwom ta n'irapara n'aru ihe-nketa Jehova, si, Je, fè chi ọzọ òfùfè.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan