Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 21:17 - Bible Nso

17 Ma Abishai nwa Zeruaia yere ya aka, tib͕ue onye Filistia ahu, me ka ọ nwua. Mb͕e ahu ndikom Devid ṅuru ya iyi, si, I gaghi eso ayi pua ibu agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ma Abishai nwa Zeruaya bịara nyere Devid aka, tigbuo onye Filistia ahụ. Site nʼoge ahụ, ndị ikom Devid ṅụrụ iyi sị ya, “Ị gaghị esokwa anyị gaa ibu agha ọzọ! Ka a ghara imenyụ oriọna Izrel.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 21:17
14 Iomraidhean Croise  

Ma, le, ab͕uru-ha nile ebiliwo megide nwayi nējere gi ozi, ha we si, Nye ayi onye tib͕uru nwa-nne-ya, ka ayi we me ka ọ nwua n'ọnodu ndu nwa-nne-ya onye o b͕uru, ayi gēkpochapu kwa onye-nnweta ahu: ma ha gēmenyu icheku nkem nke fọduru, we ghara idoro dim aha ma-ọbu ndi fọduru n'elu uwa.


Devid we zipu ndi ahu, otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Abishai nwa Zeruaia, nwa-nne Joab, na otù uzọ n'uzọ atọ n'aka Itai, bú onye Gat Eze we si ndi-ya, Aghaghm iso unu pua, ọbuná mu onwem.


Ndi-ya we si, I gaghāpu: n'ihi na ọ buru na ayi ab͕alaga ab͕alaga, ha agaghi-atukwasi ayi obi: ọ buru kwa na nkera nime ayi anwua, ha agaghi-atukwasi ayi obi: n'ihi na ub͕u a orú nnù ndikom na nnù ise dika ayi di; ma ub͕u a ọ di nma ka i buru ayi onye-iye-aka site n'obodo.


Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere.


N'ihi na Gi onwe-gi bu oriọnam, Jehova: Jehova nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu.


Ma nwa-ya ka M'gēnye otù ebo, ka Devid, bú orùm, we nwe oriọna ubọchi nile n'irum na Jerusalem, bú obodo nke M'rọputaworo Onwem itiye aham n'ebe ahu.


Ma n'ihi Devid ka Jehova, bú Chineke-ya, nyere ya oriọna na Jerusalem, ime ka nwa-ya bilie n'ọnọdu ya, na ime ka Jerusalem guzo:


N'ebe ahu ka M'gēme ka mpi Devid nwere pue: Edoworom onye nkem etere manu oriọna n'usoro.


Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa: Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ.


Chineke buru ayi ebe-nb͕abà na ike, O mewo ka achọta Ya n'iye aka nke-uku na nkpab͕u nile.


Johanan nwa Karea we gwa Gedalaia okwu na nzuzo nime Mizpa, si, Biko, ka m'je, m'gētib͕u kwa Ishmael nwa Netanaia, ma ọ dighi onye ọ bula gāma: n'ihi gini ka o gētib͕u gi onwe-gi, Juda nile ewe b͕asa, bú ndi achikọtaworo n'ebe i nọ, ndi Juda fọduru ewe la n'iyì?


Onye ahu bu oriọna ahu nke nēre ere nenwu kwa: unu onwe-unu chọ-kwa-ra ka obi tọ unu ụtọ nke-uku n'ìhè-ya nwa oge.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan