Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




2 Samuel 21:15 - Bible Nso

15 Ma ndi Filistia nwere agha ọzọ ha nēbuso Israel; Devid we rida, ya na ndi-orù-ya, buso ndi Filistia agha; Devid we da #mbà.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 Emesịa, ndị Filistia busokwara Izrel agha ọzọ. Devid na ndị agha ya pụkwara ịlụso ha ọgụ. Nʼoge ha na-alụ ọgụ a, ike gwụrụ Devid nke ukwuu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




2 Samuel 21:15
14 Iomraidhean Croise  

Ishbi-benob, nke di n'etiti umu Rafa, onye ọtùtù ube-ya di ọgu shekel ọla iri-na-ise n'ọtùtù, ekewo-kwa-ra onye ahu ihe-agha ọhu, o we si na ya gētib͕u Devid.


Ndi Filistia we nu na ha tere Devid manu ibu eze Israel, ndi Filistia nile we rigo ichọ Devid; Devid we nu ya, rida n'ebe ahu ewusiri ike.


Ndi Filistia we rigo kwa ọzọ, b͕asa onwe-ha na ndagwurugwu Refaim.


Devid we me otú a, dika Jehova nyere ya iwu; o we tib͕ue ndi Filistia site na Geba rue ebe i nāba Gezea.


O rue, mb͕e nka gasiri, na Devid tib͕uru ndi Filistia, me kwa ka ha ruru ala: Devid we nara n'aka ndi Filistia bridle nke isi obodo-ha.


O rue, mb͕e ihe a gasiri, na agha biliri na Gezea nke ebusoro ndi Filistia: mb͕e ahu Sibekai onye Husha tib͕uru Sipai, nke sitere n'umu Rafa: ewe me ka ha ruru ala.


Ọzọ, ọbuná ure agadi na isi-awọ arapulam, Chineke; Rue mb͕e m'gēgosi ọb͕ọ ọzọ ogwe-aka-Gi Gosi kwa onye ọ bula nke gābia idi-ike-Gi.


Etufulam na mb͕e agadi; Mb͕e ikem gwusiri arapulam.


Anu-arum na obim agwusiwo: Oké nkume nke obim na òkèm ka Chineke bu rue mb͕e ebighi-ebi.


n'ubọchi ahu mb͕e ndi nēdebe ulo gāma jijiji, mb͕e ndi bu dìnkpà gērulata onwe-ha, mb͕e ndinyom nke nēgwe nri gākwusi n'ihi na ha di ole-na-ole, mb͕e agēme ka anya b͕achie ndinyom nēsi na window elepu anya,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan